4 Ma Pita malitere, we kọrọ ha okwu ahu n'usoro, si,
4 Pita kọwaara ha ihe niile mere na otu o si mee, na-asị.
Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu: Ma okwu nwuta nākpali iwe.
ma asi na O jighi ilu Ọ dighi-agwa ha okwu: ma mb͕e Ya na ha nọ iche Ọ nākọrọ ndi nke Ya nēso uzọ-Ya ihe nile.
ọ di-kwa-ram nma, ebe m'soro ihe nile nke-ọma site na mbu, ka m'dere gi ka o si me, Teọfilọs di oké ebube;
Mb͕e ha ruru, me kwa ka nzukọ Kraist zukọta, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me, kọ-kwa-ra ha na O meghereri ọnu-uzọ okwukwe nye ndi mba ọzọ.