Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọrụ Ndị Ozi 1:22 - Bible Nso

22 nāmalite na baptism nke Jọn, rue ubọchi anapuru Ya n'ebe ayi nọ rigo n'elu-igwe, otù onye nime ndia aghaghi iso ayi buru onye-àmà nke nbilite- n'ọnwu-Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 bido nʼoge Jọn na-eme baptizim ruo nʼụbọchị Jisọs si nʼetiti anyị rigoro nʼeluigwe. Otu onye nʼime ndị a ga-eso anyị bụrụ onye akaebe nke mbilite nʼọnwụ ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọrụ Ndị Ozi 1:22
16 Iomraidhean Croise  

O rue na mb͕e ahu, Jisus siri na Nazaret nke Galili bia, Jọn we mee Ya baptism nime Jọdan.


Ya mere, otú a, mb͕e Ọ gwasiri ha okwu, ewe kuru Onye-nwe-ayi Jisus rigo n'elu-igwe, O we nọdu n'aka-nri nke Chineke.


Unu onwe-unu bu ndi-àmà nke ihe ndia.


Ma mb͕e emere ndi-Ju nile baptism, o rue, mb͕e emesikwara Jisus baptism, mb͕e Ọ nēkpe kwa ekpere, na emeghere elu-igwe,


unu onwe-unu nāb͕a kwa àmà, n'ihi na Mu na unu nọ site na mbu.


ndi si-kwa-ara, Ndikom nke Galili, gini mere unu nēguzo nēle anya n'elu-igwe? Jisus nka, Onye anapuru n'ebe unu nọ rigo n'elu-igwe, gābia n'otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ nāga n'elu-igwe.


rue ubọchi anara Ya n'elu, mb͕e O sitere na Mọ Nsọ nyesia ndi-ozi-Ya ndi Ọ rọputarari iwu:


Jisus nka ka Chineke mere ka O si n'ọnwu bilie, nke ayi onwe-ayi nile bu ndi-àmà-ya.


Ọ bu kwa ike uku ka ndi-ozi ji ab͕a àmà-ha bayere nbilite-n'ọnwu nke Onye-nwe-ayi Jisus: oké amara dikwasi-kwa-ra ha nile.


àyi onwe-ayi gēsi aṅa b͕anari, ma ọ buru na ayi leghara oké nzọputa di otú a anya? bú nzọputa nke eburu uzọ kwu site n'ọnu Onye-nwe-ayi, ndi nuru ya we me ka o guzosie ike rue ebe ayi nọ;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan