Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 9:29 - Bible Nso

29 Moses we si ya, Mb͕e m'si n'obodo pua, M'gāb͕asara Jehova ọbu-akam abua; éb͕è-elu-igwe nile gākwusi, ákú-miri-ígwé agaghi-adi kwa ọzọ; ka i we mara na Jehova nwe uwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Mosis gwara Fero sị ya, “Mgbe m si nʼobodo a pụọ, aga m esetipụ aka m nʼebe Onyenwe anyị nọ, egbe eluigwe a, na ifufe a nke ya na mkpụrụ mmiri so ga-akwụsịkwa. Site na nke a, ị ga-amata na ụwa niile bụ nke Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 9:29
19 Iomraidhean Croise  

Solomon we guzo n'iru ebe-ichu-àjà Jehova n'iru nkpọkọta nile nke Israel, we b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe elu-igwe di:


ekpere ọ bula, aririọ ọ bula, nke gādiri madu ọ bula, ma-ọbu nke gādiri ndi-Gi nile, bú Israel, ndi gāmara, nwoke ọ bula ihe-otiti nke obi-ya, o we b͕asa ọbu-aka-ya abua n'ebe ulo a di:


Ma na mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi, esirim n'iweda onwem n'ala bilie, ọbuná na ndọwa na uwe-nwudam; m'we ruru ala n'ikperèm b͕asara Jehova, bú Chinekem, ọbu-akam abua;


Ọ buru na gi onwe-gi edozie obi-gi, We b͕asa ọbu-aka-gi abua n'ebe Ọ nọ;


Ihe nile nke tọrọ Jehova utọ, nke ahu ka O meworo, N'elu-igwe, na n'uwa, na n'oké osimiri nile, na ob͕u-miri nile.


Ab͕asawom akam abua n'ebe I nọ: Nkpuru-obim di ka ala nke ida-#mbà n'ebe I nọ. Selah


Ọ buru na agu aguam, M'gaghi-agwa gi: N'ihi na Mu nwe elu-uwa dum madu bi na ùjú-ya.


Ma ub͕u a, ọ buru na unu ege nti n'olum n'ezie, ọ buru kwa na unu edebe ọb͕ub͕a-ndum, unu gābu-kwa-ram ihe nke akam kari ndi nile: n'ihi na ọ bu Mu nwe uwa nile:


n'ihi na n'ubọchi isi ka Jehova mere elu-igwe na uwa, na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha, Ọ we zuru ike n'ubọchi nke-asa: n'ihi nka ka Jehova gọziri ubọchi-izu-ike, do kwa ya nsọ.


M'gēkewapu n'ubọchi ahu ala Goshen, nke ndim nēguzo n'elu ya, ya mere odudu agaghi-adi n'ebe ahu; ka i we mara na Mu onwem bu Jehova n'etiti uwa.


Eron we setipu aka-ya n'elu miri nile nke Ijipt; awọ we rigo, kpuchie ala Ijipt.


Moses we si n'ebe Fero nọ, si n'obodo, pua, ọ we b͕asara Jehova ọbu-aka-ya abua: éb͕è-elu-igwe nile na ákú-miri-ígwé we kwusi, awusighi miri-ozuzo n'ala.


Ọzọ, mb͕e unu nāb͕asa ọbu-aka-unu abua, M'gēzonari unu anyam abua: ọbuná mb͕e unu nēkpe ọtutu ekpere, M'gaghi-adi nānu: aka-unu juputara n'ọbara.


n'ihi na uwa bu nke Onye-nwe-ayi, na ùjú-ya.


Ma ọ buru na onye ọ bula asi unu, Achuru ihe a n'àjà, unu erila, n'ihi onye ahu nke gosiri ya, na n'ihi akọ-na-uche:


Le, Jehova, bú Chineke-gi, nwe elu-igwe, na elu-igwe nke elu-igwe nile, na uwa, na ihe nile nke di nime ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan