Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 9:28 - Bible Nso

28 Riọnu Jehova; n'ihi na o zuwo, bú olu Chineke na ákú-miri-ígwé ndia; m'gēzipu kwa unu, unu agaghi-eguzo kwa ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Kpee ekpere rịọọ Onyenwe anyị nʼihi na oke mkpụrụ mmiri na egbe eluigwe a ezuola. Aga m ekwe ka unu gaa, unu agaghị atụfukwa mgbe.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 9:28
14 Iomraidhean Croise  

Eze we za, si onye nke Chineke, Biko, chọ ime ka iru Jehova, bú Chineke-gi, dajua, gi kpe kwa ekpere bayerem, ka akam we laghachikutem. Onye nke Chineke ahu we chọ ka iru Jehova dajua, aka eze we laghachikuru ya, we di ka ọ di na mbu.


Ma ub͕u a, biko, gbaghara nmehiem nání otù ub͕ò a, riọ-kwa-nu Jehova, bú Chineke-unu, ka Ọ we wezuga n'arum nání ọnwu a.


Fero we kpọ Moses, si, Jenu, fè Jehova; nání ìgwè ewu na aturu-unu na ìgwè ehi-unu ka agēdebe: ka umu-ntakiri-unu so kwa unu je.


Ewe me ka Moses na Eron biaghachikute Fero: ọ si ha, Jenu, fè Jehova, bú Chineke-unu: ònye na onye bu ndi nēje?


Jehova we si Moses, Otù ihe-otiti fọduru M'gēme ka ọ bia n'aru Fero na n'aru ndi Ijipt; emesia o gēsi n'ebe a zipu unu: mb͕e ọ nēzipuzu unu nile, ọ ghaghi ichupu unu n'ebe a.


Fero we kpọ Moses na Eron, si, Jenu, chuara Chineke-unu àjà n'ala nka.


Fero we si, Mu onwem gēzipu unu, ka unu we chuara Jehova, bú Chineke-unu, àjà n'ọzara; ọ bu nání na unu agaghi-eje ebe di anya nke-uku: riọrọnum aririọ.


ọ bu kwa n'aru gi, na n'aru ndi-gi, na n'aru ndi-orù-gi nile, ka awọ ahu gārigo.


Fero we kpọ Moses na Eron, si, Riọnu Jehova, ka O wezuga awọ n'ebe m'nọ, na n'ebe ndim nọ; m'gēzipu kwa ndi Israel, ka ha we chuara Jehova àjà.


Biko, juara ayi Jehova ase; n'ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, ebusowo ayi agha: eleghi anya Jehova gēmeso ayi dika oké ọlu-Ya nile si di, we me ka o si n'aru ayi rigo la.


Ndi Israel we biakute Moses, si, Ayi emehiewo, n'ihi na ayi ekwuwo okwu megide Jehova, megide kwa gi; gi kpere Jehova, ka Ọ we wezuga agwọ ndia n'aru ayi. Moses we kpe ekpere n'ihi ndi Israel.


Saimon we za, si, Unu onwe-unu riọrọm Onye-nwe-ayi, ka ihe ọ bula nime ihe unu kwuworo ghara ibiakwasim.


Ndi Israel nile we si Samuel, Kpere Jehova, bú Chineke-gi, ekpere bayere ndi-orù-gi, ka ayi ghara inwu: n'ihi na ayi atukwasiwo ihe ọjọ a na nmehie-ayi nile, n'iriọrọ onwe-ayi eze.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan