Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 9:12 - Bible Nso

12 Jehova we me ka obi Fero di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova gwara Moses.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ma Onyenwe anyị mere ka obi Fero sie ike. Ọ jụrụ ige Mosis na Erọn ntị dịka Onyenwe anyị gwara Mosis na ọ ga-eme.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 9:12
13 Iomraidhean Croise  

Jehova we si Moses, Bakuru Fero: n'ihi na Mu onwem emewo ka obi-ya na obi ndi-orù-ya di arọ́, ka M'we tiye ihe-iriba-ama ndia n'etiti ha:


Ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel.


Moses na Eron we me ihe-ebube ndia nile n'iru Fero: ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel n'ala-ya.


Jehova we me ka obi Fero, bú eze Ijipt, di ike, ọ we chu umu Israel n'azu: umu Israel nēwere kwa aka di elu pua.


Jehova we si Moses, Mb͕e i je ilaghachi n'Ijipt, le anya ka i me n'iru Fero ihe-ebube nile nke M'tiyere n'aka-gi: ma Mu onwem gēme ka obi-ya di ike, ọ gaghi-ezipu kwa ndim.


Ma Fero agaghi-ege unu nti, M'gētiye kwa akam n'aru ndi Ijipt, were kwa ikpé uku di iche iche me ka usu nile nke ndi-agha nkem, bú ndim umu Israel, si n'ala Ijipt puta.


Fero we ziga, ma, le, ọ dighi ma ọbuná otù nwupuru nime anu-ulo Israel. Obi Fero we di arọ́, o zipughi kwa ndi Israel.


O mewo ka anya-ha kpue ìsì, O me-kwa-ra ka obi-ha me etili; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike.


Ya mere otú a ọ bu onye Ọ nāchọ ka Ọ nēmere ebere, ọ bu kwa onye Ọ nāchọ ka ọ nēme ka o nwe obi-etili.


N'ihi na o sitere n'aka Jehova ime ka obi-ha di ike, izute Israel n'agha, ka O we wezuga ha ka ebibie ha, ka ha we ghara inwe amara, kama ka O we kpochapu ha, dika Jehova nyere Moses iwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan