Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 8:4 - Bible Nso

4 ọ bu kwa n'aru gi, na n'aru ndi-gi, na n'aru ndi-orù-gi nile, ka awọ ahu gārigo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Awọ ndị a ga-arịgokwa nʼahụ gị, na nʼahụ ndị gị, na nʼahụ ndị na-ejere gị ozi.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 8:4
13 Iomraidhean Croise  

Eze we za, si onye nke Chineke, Biko, chọ ime ka iru Jehova, bú Chineke-gi, dajua, gi kpe kwa ekpere bayerem, ka akam we laghachikutem. Onye nke Chineke ahu we chọ ka iru Jehova dajua, aka eze we laghachikuru ya, we di ka ọ di na mbu.


Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha, We me ka ha kpafue nebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe uzọ nādighi.


Ma ub͕u a, biko, gbaghara nmehiem nání otù ub͕ò a, riọ-kwa-nu Jehova, bú Chineke-unu, ka Ọ we wezuga n'arum nání ọnwu a.


Jehova we me otú a; odudu nke bara uba nke-uku we ba n'ulo Fero na ulo ndi-orù-ya: ọ bu kwa n'ala Ijipt nile ka ebibiri ala ahu n'ihi odudu.


osimiri Nail gēnuputa awọ, nke gārigo ba n'ulo-gi, na n'ime-ulo-ndina-gi, na n'elu ihe-ndina-gi, na n'ulo ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi, na n'ite-ọku-gi nile, na n'ihe-gi i ji agwọ achicha:


Jehova we si Moses, Si Eron, Setipu aka-gi, ya na nkpa-n'aka-gi, n'elu osimiri nile, na n'elu osimiri Nail nile, na n'elu ọdọ-miri nile, me ka awọ rigota n'ala Ijipt.


Riọnu Jehova; n'ihi na o zuwo, bú olu Chineke na ákú-miri-ígwé ndia; m'gēzipu kwa unu, unu agaghi-eguzo kwa ọzọ.


Nání ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha ka ndi-isi Zoan bu; ndum-ọdu nke ndi mara ihe nime ndi-ndum-ọdu Fero aghọwo ndum-ọdu anu-ọhia: ùnu si aṅa si Fero, Nwa ndi mara ihe ka m'bu, nwa ndi-eze nke mb͕e ochie?


Jehova gēti kwa Ijipt ihe, nēti, nāgwọ kwa; ha gālaghachikute kwa Jehova, O we kwe ka ha riọta ihe ha nāriọ, Ọ gēme kwa ka aru di ha nma.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezubewo ya, ime ka npako nke ima-nma nile ghara idi nsọ, ime ka elelìa ndi-nsọpuru nile nke uwa.


Ub͕u a mu onwem, bú Nebukadneza, nāja, nēbuli, nāsọpuru Eze nke elu-igwe; n'ihi na ọlu-Ya nile bu ezi-okwu, uzọ-Ya nile bu kwa ikpé: ọzọ, ndi nējeghari na npako, Ọ puru ime ka ha di ala.


Ndi Israel we biakute Moses, si, Ayi emehiewo, n'ihi na ayi ekwuwo okwu megide Jehova, megide kwa gi; gi kpere Jehova, ka Ọ we wezuga agwọ ndia n'aru ayi. Moses we kpe ekpere n'ihi ndi Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan