Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 8:20 - Bible Nso

20 Jehova we si Moses, Bilie n'isi-ututu, guzo onwe-gi n'iru Fero; le, ọ nāputa ije miri; i gāsi kwa ya, Otú a ka Jehova siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Bilie nʼisi ụtụtụ echi jekwuru Fero. Mgbe ọ ga-aga nʼosimiri, gwa ya okwu sị, ‘Nke a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 8:20
11 Iomraidhean Croise  

O kwuru okwu, odudu we bia, Na anwu ntà n'ókè-ala-ha nile.


Ọ nēzite odudu n'etiti ha, nke nātab͕u ha; Ọ nēzite kwa awo, nke nēbibi ha.


Nwa-nwayi Fero we ridata isa aru n'osimiri Nail; umu-ab͕ọghọ-ya we nējeghari n'akuku osimiri Nail ahu; o we hu ub͕ọ ahu n'etiti ami, zìe orù-ya nwayi iweta ya.


Ha gēge kwa nti n'olu-gi: i gābiakute kwa eze Ijipt, gi onwe-gi na ndi-okenye Israel, unu gāsi kwa ya, Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, ezutewo ayi: ub͕u a kwa, biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n'ọzara, ka ayi we chuara Jehova, bú Chineke-ayi, àjà.


M'we si gi, Zipu nwam, ka ọ we fèm; i we ju izipu ya: le, Mu onwem gaje ib͕u nwa-gi, bú ọkpara-gi.


Emesia Moses na Eron biara, si Fero, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, nāsi, Zipu ndim, ka ha we merem ememe n'ọzara.


Ha si, Chineke nke ndi-Hibru ezutewo ayi: biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n'ọzara, chuara Jehova, bu Chineke-ayi, aja: ka Ọ we ghara iwere ajọ ọria nēfe efe, ma-ọbu mma-agha, zute ayi.


Jekuru Fero n'ututu; le, ọ nāpu ije miri; i gēguzo onwe-gi n'usọ osimiri Nail izute ya; nkpa-n'aka ahu kwa nke b͕anwere ghọ agwọ, i gēwere ya n'aka-gi.


Jehova we si Moses, Bakuru Fero, si ya, Otú a ka Jehova siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.


N'ihi na, ma ọ buru na i dighi-ezipu ndim, le, M'gaje izite n'aru gi, na n'aru ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi, na nime ulo-gi nile, odudu: ulo nile nke ndi Ijipt gēju kwa n'odudu ahu, ya na ala nke ha di n'elu ya.


Jehova we si Moses, Bilie n'isi-ututu, guzo onwe-gi n'iru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan