Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 8:18 - Bible Nso

18 Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we were ihe-nzuzo-ha di iche iche me otú a, ime ka anwu ntà puta, ma ha apugh: anwu ntà ahu we di n'aru madu, na n'aru anumanu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ndị Ijipt na-eme majiki gbalịrị iji ihe nzuzo ha mee otu ihe ahụ Erọn mere, ma ha enweghị ike ime ka anwụ nta ọbụla pụta. Ebe ọ bụ na anwụ nta ndị a jupụtara nʼahụ mmadụ na nʼahụ anụmanụ niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 8:18
13 Iomraidhean Croise  

O rue, n'ututu, na mọ-ya b͕asasiri; o we ziga kpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile nke Ijipt, na ndi-ya nile mara ihe: Fero we kọrọ ha nrọ-ya; ma ọ dighi onye nākọrọ Fero isi-ha.


ha ahuritaghi ibe-ha anya, ọ dighi kwa onye si n'ebe ọ nọ bilie ubọchi atọ: ma umu Israel nile nwere ìhè n'ebe-obibi nile ha.


Fero we kpọ kwa ndi mara ihe, kpọ kwa ndi-mb͕asi: ha onwe-ha kwa, bú ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt, we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a.


Ha we tuda, nwoke ọ bula nkpa-n'aka-ya, ha we ghọ ogologo anu: ma nkpa-n'aka Eron lodara nkpa-n'aka-ha.


Ndi-ode-akwukwọ di nsọ we were ihe-nzuzo-ha di iche iche me otú a, we me ka awọ rigo n'elu ala Ijipt.


Ndi-ode-akwukwọ di nsọ apughi kwa iguzo n'iru Moses, n'ihi ihe-ofifi ahu; n'ihi na ihe-etuto ahu di n'aru ndi-ode-akwukwọ di nsọ, na n'aru ndi Ijipt nile.


Òle ebe ha nọ kwa, bú ndi-gi ndi mara ihe? biko, ka ha gosi kwa gi; ka ha mara kwa ihe Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubeworo bayere Ijipt.


Mb͕e ahu ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nēkè elu-igwe batara: mu onwem we ze nrọ ahu n'iru ha; ma ha emeghi ka m'mara isi-ya.


Mb͕e ahu ndi-amam-ihe nile nke eze batara: ma ha apughi igu ihe ahu edere, ma-ọbu ime ka eze mara isi-ya.


O we si ha, Ahurum Setan ka ọ darari dika àmùmà pua n'elu-igwe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan