Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 8:10 - Bible Nso

10 Ọ si, Echi. Ọ si, Ya di ka okwu-gi si di: ka i we mara na ọ dighi onye di ka Jehova, bú Chineke-ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Mgbe ahụ Fero sịrị Mosis, “Achọrọ m ka i mee ya echi.” Mosis zaghachiri Fero sị, “Ọ dị mma, ka ọ dịrị dịka i kwuru. Mgbe ahụ, ị ga-amata na o nweghị onye dịka Onyenwe anyị Chineke anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 8:10
21 Iomraidhean Croise  

N'ihi nka I di uku, Onye-nwe-ayi Jehova: n'ihi na ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi.


Jehova, ọ dighi onye di ka Gi, ọ dighi kwa Chineke ma-ọbughi Gi, dika ihe nile si di nke ayi nuworo na nti-ayi.


Ka ha we mara na Gi onwe-gi, Onye aha-Gi bu Jehova, nání Gi, Bu Onye kachasi ihe nile elu n'elu uwa nile.


Ọ dighi onye di ka Gi n'etiti chi nile, Onye-nwe-ayi; Ọ dighi kwa ọlu di ka ọlu-Gi nile.


Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo: N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah


Ònye di ka Gi n'etiti chi nile, Jehova? Ònye di ka Gi, di ebube n'idi-nsọ? Onye anātu egwu n'otuto nile, nēme ihe-ebube di iche iche.


Moses we si Fero, Nya isi n'arum: òle mb͕e ka m'gāriọrọ gi aririọ, riọ-kwa-ra ndi-orù-gi, riọ-kwa-ra ndi-gi, ka ekpochapu awọ n'ebe i nọ na n'ebe ulo-gi nile di? nání n'osimiri Nail ka ha gāfọdu.


N'ihi na ọ bu na mb͕e a ka Mu gaje izite ihe-otitim nile n'obi-gi, na n'aru ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi; ka i we mara na ọ dighi onye di kam n'uwa nile.


Moses we si ya, Mb͕e m'si n'obodo pua, M'gāb͕asara Jehova ọbu-akam abua; éb͕è-elu-igwe nile gākwusi, ákú-miri-ígwé agaghi-adi kwa ọzọ; ka i we mara na Jehova nwe uwa.


Anyala isi bayere echi; N'ihi na i maghi ihe chi gābọ.


Ònye kwa ka unu gāsi na Chineke yiri ya? ma-ọbu ìhe-oyiyi gini ka unu gēdo n'usoro n'ebe Ọ nọ?


Ònye kwa ka unu gāsi na Mu yiri ya, M'we ra ka ya? ka Onye Nsọ nāsi.


Chetanu ihe mbu nile site na mb͕e ebighi-ebi gara aga: n'ihi na Mu onwem bu Chineke, ọ dighi kwa Chineke ọzọ di; abum Chineke, ọ dighi kwa otù efu di ka Mu onwem;


Onye-nwe-ayi, Jehova, Gi onwe-gi amalitewo ime ka orù-Gi hu idi-uku-Gi, na aka-Gi di ike: n'ihi na òle chi di n'elu-igwe ma-ọbu n'uwa, nke nēme dika omume-Gi nile si di, na dika idi-ike-Gi nile si di?


N'ihi na oké nkume-ha adighi ka Oké Nkume-ayi, Ndi-iro-ayi bu kwa ndi-ikpe.


Ọ dighi onye di ka Chineke, gi Jeshurun, Onye elu-igwe nēbu dika inyinya n'iyere gi aka, Onye mbara-ígwé nēbu kwa nime nbili-elu-Ya.


Emewo ka gi onwe-gi hu ya, ka i we mara na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Ya;


I mawo kwa ta, cheta-kwa-ra obi-gi, na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke n'elu-igwe di n'elu na n'elu uwa di n'okpuru: ọ dighi onye ọzọ.


ma unu bu ndi nāmataghi ihe gēme echi. Ǹdu-unu bu gini? N'ihi na unu bu alulu, nke nāputa ìhè nwa oge, emesia ọ we pua n'anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan