Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 7:23 - Bible Nso

23 Fero we chigharia, ba n'ulo-ya, ma o tiyeghi obi-ya ọbuná na nka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Fero tụgharịrị laghachi nʼụlọeze ya, na-echeghị echiche banyere ihe niile ahụ e mere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 7:23
20 Iomraidhean Croise  

Gini ka madu bu, na I nēme ya ka ọ di uku, Na I nātukwasi kwa ya obi-Gi,


Unu atukwasila obi na nmeb͕u, Ọzọ, n'ipunara madu ihe unu aghọla ihe-efu: Mb͕e àkù nābakari uba, unu atukwasila ya obi.


Ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a: obi Fero we di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.


Ndi Ijipt nile we gwue olùlù buruburu osimiri Nail inwe miri-ọṅuṅu; n'ihi na ha apughi iṅu miri osimiri Nail.


Onye nātu egwu okwu Jehova n'etiti ndi-orù Fero mere ndi-orù-ya na anu-ulo-ya ka ha b͕aghachi n'ulo:


ma onye nētiyeghi obi-ya n'okwu Jehova rapuru ndi-orù-ya na anu-ulo-ya n'ọhia.


Tọ nti-gi n'ala, nu okwu nile nke ndi mara ihe, Tukwasi kwa obi-gi n'ihe-ọmumam.


Mu onwem we hu, m'we tukwasi obim na ya: Ahurum ya, we nata idọ-aka-na-nti.


Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nātu oké egwu mb͕e nile: Ma onye nēme ka obi-ya sie ike gādabà n'ihe ọjọ.


Onye anābara nba ọtutu mb͕e ma ọ nēkwesi olu-ya ike, N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.


Jehova, ebuliwo aka-Gi, ma ha adighi-ahu: ha gāhu ekworo I nēkworo ndi-Gi, ihere ewe me ha; ọzọ, ọku nke ndi nēmegide Gi gērichapu ha.


I we si, Rue mb͕e ebighi-ebi ka m'gabu nwanyi-nwenu: i we ghara itukwasi ihe ndia n'obi-gi, i chetaghi ikpe-azu-ya.


Ma ha atughi oké egwu, ha adọwaghi kwa uwe-ha, bú eze na ndi-orù-ya nile ndi nānu okwu ndia nile.


Jehova, ànya-Gi abua adighi n'ebe ikwesi-ntukwasi-obi di? I tiwo ha ihe, ma o wutaghi ha; I mewo ka ha gwusia, ma ha ajuwo inara idọ-aka-na-nti: ha emewo ka iru-ha di ike nkume; ha ajuwo ilata.


Nwoke ahu we gwam okwu, si, Nwa nke madu, were anya-gi abua hu, were kwa nti-gi abua nu, tukwasi kwa obi-gi n'ihe nile Mu onwem nēme ka i hu; n'ihi na ọ bu ime ka i hu ha ka emeworo ka i bia ebe a: gosi ulo Israel ihe nile nke gi onwe-gi nāhu.


Hunu n'etiti mba nile, legide-kwa-nu, ka o ju kwa unu anya nke-uku nke-uku: n'ihi na ọlu ka M'nālu n'ubọchi-unu, nke unu nāgaghi-ekwe, mb͕e agākọrọ unu ya.


Ọ buru na unu agaghi-anu, ọ buru kwa na unu agaghi-etiye ya n'obi-unu, inye aham nsọpuru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gēzite kwa ọbubu-ọnu ahu n'aru unu, bua ngọzi nile unu ọnu: e, abuwokwam ha ọnu, n'ihi na unu adighi-etiye ya n'obi.


o we si ha, Tukwasi obi-unu n'okwu nile nke mu onwem nāb͕ara unu àmà ta; nke unu gēnye umu-unu n'iwu, ka ha lezie anya ime okwu nile nke iwu a.


Ma na mb͕e ọnwu-ya ndinyom ndi nēguzo n'akuku ya we kwue, si, Atula egwu; n'ihi na nwoke ka i muworo. Ma ọ zaghi, ọ tukwasighi kwa obi-ya na ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan