Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 7:1 - Bible Nso

1 Jehova we si Moses, Le, emewom i ka i ghọrọ Fero chi: Eron, bú nwa-nne-gi, gābu kwa onye-amuma-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Emeela m gị ka ị dịrị ka Chineke nʼebe Fero nọ. Nwanne gị Erọn ga-abụkwa onye amụma gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 7:1
11 Iomraidhean Croise  

Ọ si ya, Le, m'huwo kwa gi iru-ọma n'okwu a, na m'gaghi-akwatu obodo a nke i kwuworo okwu bayere ya.


Elaija we kuru nwata ahu, si n'ime-ulo-elu ahu kudata ya n'ulo, nye ya nne-ya: Elaija we si, Le, nwa-gi nādi ndu.


Ma Elaisha nānọdu n'ulo-ya, ndi-okenye nānọdu kwa n'ebe ọ nọ: eze we ziga otù nwoke site n'iru ya: ma tutu onye-ozi ahu abiakute ya, ya onwe-ya siri ndi-okenye, Ùnu ahuwo na nwa ob͕u-madu a ezitewo iwezuga isim? hunu, mb͕e onye-ozi ahu nābia, mechienu uzọ, were ibo-uzọ kwagide ya: òlu ukwu abua nke onye-nwe-ya adighi n'azu ya?


N'iru ndi bu nna-ha ka Ọ luru oké ọlu, N'ala Ijipt, n'ọhia Zoan.


Mu onwem siri, Chi ka unu bu, Ọ bu kwa umu nke Onye kachasi ihe nile elu ka unu bu.


Lenu, n'ihi na Jehova enyewo unu ubọchi-izu-ike, n'ihi nka Ya onwe-ya nēnye unu nri nke ubọchi abua n'ubọchi nke-isi; nọdunu, onye ọ bula n'ebe ọ nọ, ka onye ọ bula ghara isi n'ọnọdu-ya pua n'ubọchi nke-asa.


Ọ̀ di ihe nke madu nāsi, Le nka, ihe ọhu ka ọ bu? na mb͕e di anya gara aga ka ọ diworo, na mb͕e nile ebighi-ebi nke buru ayi uzọ.


le, emewom gi ta ka i lekọta mba nile, lekọta kwa ala-eze nile, iropu, na ikwada, na ime ka ha la n'iyì, na itikpọ, na iwu ulo, na iku ihe.


Mba ahu nke ha gābu orù-ha ka Mu onwem gēkpe kwa ikpé, ka Chineke kwuru: mb͕e ihe ndia gasiri ha gāputa kwa, kpe-kwa-ram n'ebe a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan