Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 6:5 - Bible Nso

5 Ọzọ kwa, Mu onwem anuwo isu-ude umu Israel, ndi ndi Ijipt nēme ka ha buru orù; echetawokwam ọb͕ub͕a-ndum.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ugbu a, anụla m ịsụ ude ụmụ Izrel, bụ ndị ahụ ndị Ijipt mere ka ha bụrụ ndị ohu. Echetakwala m ọgbụgba ndụ m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 6:5
11 Iomraidhean Croise  

Ma Chineke chetara Noa, na anu nile di ndu, na anu-ulo nile nke ya na ha nọ n'ub͕ọ; Chineke we me ka ifufe gabiga n'elu uwa, miri we taba;


M'we cheta ọb͕ub͕a-ndum, nke di n'etiti mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile; miri agaghi-aghọ kwa iju-miri ọzọ ibibi anu-aru nile.


O chetawo ọb͕ub͕a-ndu-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, Okwu O nyere nnù ọb͕ọ abua na ọgu iri n'iwu;


O rue, n'ọtutu ubọchi ahu, na eze Ijipt nwuru: umu Israel we nēze ume n'ihi òfùfè-ha, ha we tie nkpu, ntiku ha tikuru Chineke we rigorue Chineke nti, n'ihi òfùfè ahu.


Chineke we nu isu-ude-ha, Chineke we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya, nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob b͕ara.


Jehova we si, Ahuwom n'ezie nweda-n'ala nke ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam iti-nkpu-ha n'ihi ndi nāchi ha n'ihe-ike; n'ihi na amawom ihe-nb͕u-ha nile;


Eze Ijipt we si ha, N'ìhi gini ka unu, bú Moses na Eron, nēme ka ndi ahu rapu ọlu-ha nile? jenu ibu-unu.


Na nkpab͕u nile ha Ya ka anākpab͕u, ọ bu kwa mọ-ozi nke iru-Ya zọputara ha: n'ihu-n'anya-Ya na n'ọmiko-Ya Ya onwe-ya b͕aputara ha; O we palie ha, kuru ha ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.


O nyeworo Israel nwa-Ya aka, Ka O we cheta ebere


Imere nna-ayi-hà ebere, Na icheta ọb͕ub͕a-ndu nsọ Ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan