Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 6:4 - Bible Nso

4 Ọzọ kwa, emewom ka ọb͕ub͕a-ndum guzosie ike n'ebe ha nọ, inye ha ala Kenean, bú ala ọnọdu-ọbìa nile ha, nke ha nọri dika ọbìa nime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Emere m ka ọgbụgba ndụ m guzosie ike nʼetiti mụ na ha, ọgbụgba ndụ nke inye ha ala Kenan ebe ha biri dịka ndị ọbịa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 6:4
21 Iomraidhean Croise  

Jehova we me ka Abram hu Ya anya, Ọ si, Nkpuru-gi ka M'gēwere ala nka nye: ọ we wuere Jehova, bú Onye ahu Nke mere ka ọ hu Ya anya, ebe-ichu-aja n'ebe ahu.


Ọ si Abram, Mara nke-ọma na nkpuru-gi gābu ọbìa n'ala nābughi nke ha, ha gēfè kwa ha; ha gēweda ha ala nnù arọ;


N'ubọchi ahu ka Jehova b͕ara ọb͕ub͕a-ndu nye Abram, si, Nkpuru-gi ka M'nyeworo ala nka, site n'osimiri Ijipt rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis:


Aghaghi ibì onye amuru n'ulo-gi, na onye eji ego-gi b͕ata, úgwù: ọb͕ub͕a-ndum gādi kwa n'anu-aru-unu ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi.


Mu onwem, le, ọb͕ub͕a-ndum di n'ebe i nọ, i gāghọ kwa nna nke ìgwè mba.


Ọbìa na onye-nnọdu ka m'bu n'etiti unu: nyenum ihe-onwunwe, bú ala-ílì, n'etiti unu, ka m'we lìpu ya n'anyam, bú onye-nkem nwuru anwu.


nọ dika ọbìa n'ala nka, M'gānọye-kwa-ra gi, gọzie gi; n'ihi na gi na nkpuru-gi ka M'gēnye ala ndia nile, M'gēme kwa ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M'ṅuru Abraham nna-gi;


M'gēme kwa ka nkpuru-gi ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, M'gēnye kwa nkpuru-gi ala ndia nile; ọ bu kwa na nkpuru-gi ka mba nile nke uwa gāgọzi onwe-ha;


Ma, le, Jehova nēguzo n'elu ya, si, Mu onwem bu Jehova, Chineke nke Abraham nna-gi, na Chineke nke Aisak' ala nke gi onwe-gi nēdina n'elu ya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi;


Ya nye kwa gi ngọzi Abraham, gi, na nkpuru-gi tiyere gi; ka i we nweta ala nke ọnọdu-ọbìa-gi nile, nke Chineke nyere Abraham.


Ma M'gēme ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'ebe i nọ; i gābata kwa n'ub͕ọ ahu, gi onwe-gi, na umu-gi ndikom, na nwunye-gi, na nwunye nile nke umu-gi ndikom tiyere onwe-gi.


N'ihi na ọ bughi otú a ka ulom di n'ebe Chineke nọ; N'ihi na ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ka Ọ b͕aworo nyem, Bú ọb͕ub͕a-ndu edoworo n'usoro n'ihe nile, nke edebewo-kwa-ra: N'ihi na nzọputam nile, na ihe-utọ nile, N'ezie Ọ gaghi-eme ka o pute.


Si, Gi ka M'gēnye ala Kenean, Bú ala-nketa-unu eji udọ̀ tùa:


Mb͕e ha bu ndikom ole-na-ole, E, nání madu ole-na-ole, na ndi-ọbìa nime ya;


Ta ka unu onwe-unu nāputa n'ọnwa Ebib.


O gēru kwa, mb͕e Jehova gēme gi ka i ba n'ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi-Haivait na ndi Jebus, nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi inye gi, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, na i gēfè òfùfè a n'ọnwa nka.


M'gēme kwa ka unu bata n'ala ahu, nke M'weliri akam iwere ya nye Abraham, nye kwa Aisak, nye kwa Jekob; M'gēnye kwa unu ya ka ọ buru ihe-nnweta: Mu onwem bu Jehova.


Tọnu nti-unu n'ala, biakutem; nurunu, nkpuru-obi-unu ewe di ndu: Mu na unu gāb͕a kwa ndu, bú ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, bú ebere nile kwesiri ntukwasi-obi nke emere Devid.


Moses we si Hobab, nwa Reuel onye Midian, bú nna nwunye Moses, Ndi nēbuli ije ka ayi bu rue ebe ahu nke Jehova kwuru okwu bayere ya, si, Nke ahu ka M'gēnye unu: soro ayi je, ayi gēme kwa gi nma: n'ihi na Jehova ekwuwo ezi ihe bayere Israel.


ma O nyeghi ya ala-nketa nime ya, é-è, Ọ nyeghi ya ebe izọkwasi ukwu-ya: O we kwe nkwa na O gēwere ya nye ya, na nkpuru-ya soro ya n'azu, ka ọ buru ihe ha nwere, mb͕e ọ kādighi nwa ọ muru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan