M'gāgabiga kwa n'ala Ijipt n'abali ahu, tib͕u nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma madu ma anumanu; ọ bu kwa n'aru chi nile nke Ijipt ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe: Mu onwem bu Jehova.
Nzukọ nile nke umu Israel we si n'ọzara Sin bulie ije, na nbuli-ije nile ha, n'okwu-ọnu Jehova, ha we ma ulo-ikwū-ha na Refidim: ma ọ dighi miri ndi Israel gāṅu.
Chineke si-kwa-ra Moses ọzọ, Otú a ka i gāsi umu Israel, Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob, O zitewom n'ebe unu nọ: nka bu aham rue mb͕e ebighi-ebi, nka bu kwa ihe-nchetam rue ọb͕ọ nile.
N'ihi ya si umu Israel, Mu onwem bu Jehova, M'gēme kwa ka unu si n'okpuru ibu nile nke ndi Ijipt pua, M'gānaputa kwa unu n'òfùfè-ha, were kwa ogwe-aka esetiri eseti, were kwa ikpé uku di iche iche, b͕aputa unu:
M'gēme kwa ka unu bata n'ala ahu, nke M'weliri akam iwere ya nye Abraham, nye kwa Aisak, nye kwa Jekob; M'gēnye kwa unu ya ka ọ buru ihe-nnweta: Mu onwem bu Jehova.
Otú a ka Jehova, Nke bu eze Israel na onye-nb͕aputa-ya, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri: Mu onwem bu onye mbu, Mu onwem bu kwa onye ikpe-azu; ọ dighi kwa Chineke ọ bula di ma ewezuga nání Mu onwem.
kama, onye nānya isi, ya nya isi na nka, na o nwere uche n'ebe M'nọ, we maram, na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ebere na ikpé ziri ezi na ezi omume n'uwa: n'ihi na ihe ndia atọwom utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ubọchi M'rọputara Israel, M'we weliere nkpuru ulo Jekob akam, me ka ha maram n'ala Ijipt, M'we weliere ha akam, si, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu;