Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 6:12 - Bible Nso

12 Moses we kwue n'iru Jehova, si, Le, umu Israel egeghm nti; Fèro gēsi kwa aṅa nuru olum, onye mu onwem bu onye anēbighi úgwù n'eb͕ub͕ere-ọnu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Mosis kwuru nʼihu Onyenwe anyị sị, “Mgbe ụmụ Izrel na-aṅaghị m ntị, olee otu Fero ga-esi ṅaa m ntị? Nke ka nke, enweghị m ike ikwu okwu nke ọma.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 6:12
16 Iomraidhean Croise  

Ma Moses siri Chineke, Ònye ka m'bu, na m'gējekuru Fero, na m'gēme kwa ka umu Israel si n'Ijipt puta?


Moses we si Chineke, Le, mb͕e mu onwem nābiakute umu Israel, si ha, Chineke nke nna-unu-hà ezitewom n'ebe unu nọ; mb͕e ha gāsikwam, Gini bu aha-Ya? ọ̀ bu gini ka m'gāsi ha?


Moses we za, si, Ma, le, ha agaghi-ekwem, ha agaghi-ege kwa nti n'olum: n'ihi na ha gāsi, Jehova emeghi ka i hu Ya anya.


Moses we si Jehova, Biko, Onye-nwe-ayi, Ọ bughi onye-ọ̀kà-okwu ka m'bu, ma-ọbu na mb͕e gara aga, ma-ọbu site na mb͕e I gwara orù-Gi okwu: n'ihi na onye ọnu-ya di arọ́, nke ire-ya di kwa arọ́, ka m'bu.


Jehova we gwa Moses na Eron okwu, nye ha iwu n'ebe umu Israel nọ, na n'ebe Fero eze Ijipt nọ, ime ka umu Israel si n'ala Ijipt pua.


Moses we si n'iru Jehova, Le, mu onwem bu onye anēbighi úgwù n'eb͕ub͕ere-ọnu, Fèro gēsi kwa aṅa gem nti?


Moses we gwa umu Israel okwu otú a: ma ha egeghi Moses nti site n'enweghi-ntachi-obi nime mọ-ha, site kwa n'òfùfè siri ike.


M'we si, Ahuhu nādirim, n'ihi na alawom n'iyì; n'ihi na onye eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ruru árú ka m'bu, ọ bu kwa n'etiti ndi eb͕ub͕ere-ọnu-ha ruru árú ka m'nēbi: n'ihi na ọ bu Eze-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ka anyam abua huworo.


M we si, Ewó, Onye-nwe-ayi Jehova! le, amaghm ikwu okwu, n'ihi na nwata ka m'bu.


Ònye ka M'gāgwa okwu, b͕a kwa àmà, ka ha we nu? le, ihe anēbighi ùgwù ka nti-ha bu, ha apughi kwa iṅa nti: le, okwu Jehova aghọworo ha ihe-ita-uta; ọ dighi-atọ ha utọ.


bú Ijipt, na Juda, na Edom, na umu Amon, na Moab, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha, ndi bi n'ọzara: n'ihi na mba nile bu ndi anēbighi úgwù, ulo Israel nile bu kwa ndi anēbighi úgwù n'obi.


Mu onwem we nējeghari kwa n'imegide ha, me ka ha ba n'ala ndi iro ha: ma ọ buru na obi-ha nke anēbighi úgwù eruru ala mb͕e ahu, ọ buru kwa na ahuhu ajọ omume-ha atọ ha utọ mb͕e ahu;


Ndi kwesiri olu ike na ndi anēbighi úgwù n'obi na nti, unu onwe-unu nālu ọ̀gù megide Mọ Nsọ mb͕e nile: dika nna-unu-hà mere, otú ahu ka unu onwe-unu nēme.


Jehova, bú Chineke-gi, gēbì kwa n'obi-gi, na obi nkpuru-gi, úgwù, iwere obi-gi nile, na iwere nkpuru-obi-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya, ka i we di ndu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan