Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 6:1 - Bible Nso

1 Jehova we si Moses, Ub͕u a ka i gāhu ihe M'gēme Fero: n'ihi na n'aka di ike ka o gēzipu ha, ọ bu kwa n'aka di ike ka ọ gāchupu ha n'ala-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Ugbu a, ị ga-ahụ ihe m ga-eme Fero. Nʼihi ike aka m, ọ ga-ezipụ ha. Nʼihi ike aka, ọ ga-achụpụ ha site nʼala ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 6:1
27 Iomraidhean Croise  

onye-isi-agha we za onye nke Chineke, si, Ma, le, ọ buru na Jehova eme window n'elu-igwe, ọ̀ gādi ka okwu a si di? Ọ si, Le, i ganēwere anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-eri nime ya:


Ọchi-agha ahu onye eze nwere, onye ọ nādabere n'aka-ya, we za onye nke Chineke, si, Le, ọ buru na Jehova eme window n'elu-igwe, ihe a, ọ̀ gādi? Ọ si, Le, i ganēwere anya-gi abua hu ya, ma i gaghi-eri nime ya.


Ọ bughi unu gēnwe ibu agha n'agha nka: guzonu onwe-unu, guzo, hu nzọputa Jehova n'etiti unu, Juda na Jerusalem: unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ: echi pukurunu ha; Jehova nọye-kwa-ra unu.


N'ihi ipunara ndi ewedara n'ala ihe, n'ihi isu-ude nke ndi-ob͕eye, Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova kwuru; M'gēdo ya na nzọputa nke o nēkusi ume ike inwe.


Okwu-ọnu Jehova nile bu okwu-ọnu di ọcha; Ha bu ọla-ọcha anuchaworo n'ite-nnucha nke nērusa n'ala, Nke esichaworo ub͕ò asa.


Site n'aka di ike na n'ogwe-aka esetiri eseti: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di.


Gi nwere ogwe-aka nke idi-ike di nime ya: Aka-Gi di ike, aka-nri-Gi di elu.


Jehova we si Moses, Otù ihe-otiti fọduru M'gēme ka ọ bia n'aru Fero na n'aru ndi Ijipt; emesia o gēsi n'ebe a zipu unu: mb͕e ọ nēzipuzu unu nile, ọ ghaghi ichupu unu n'ebe a.


O we kpọ Moses na Eron n'abali, si, Bilienu, si n'etiti ndim pua, ma unu onwe-unu ma umu Israel; je-kwa-nu, fè Jehova, dika unu kwuru.


Ndi Iiipt we di ike n'aru ndi Israel izipu ha n'ala-ha ngwa ngwa; n'ihi na ha siri, Ayi nile bu ndi nwuru anwu.


Ha we were utu ọka flour agwọrọ agwọ, bú nke ha si n'Ijipt bute, sie achicha ekoghi-eko, n'ihi na o koghi eko; n'ihi na achupuru ha n'Ijipt, ha apughi kwa inọ ọdù, ọzọ kwa, ọ dighi ihe iri n'uzọ ha doziri onwe-ha.


O gēru kwa, mb͕e nwa-gi gāju gi n'ọdi-n'iru, si, Gini bu nka? na i gāsi ya, Ike nke aka ka Jehova jiri me ka ayi si n'Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta:


Ọ gābu kwa ihe-iriba-ama n'elu aka-gi, na nkpọ-n'iru n'etiti anya-gi abua: n'ihi na ike nke aka ka Jehova jiri me ka ayi si n'Ijipt puta.


Moses we si ndi Israel, Cheta ubọchi a, nke ọ bu nime ya ka unu siworo n'Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta; n'ihi na ike nke aka ka Jehova ji me ka unu si n'ebe a puta: agaghi-eri kwa achicha koro eko.


Ọ gabu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama n'elu aka-gi, na ihe-ncheta n'etiti anya-gi abua, ka iwu Jehova we di n'ọnu-gi: n'ihi na aka di ike ka Jehova jiri me ka i si n'Ijipt puta.


Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu, guzonu onwe-unu n'ebe a, hu nzọputa Jehova, nke Ọ gēmere unu ta: n'ihi na ndi Ijipt ndi unu huworo ta, unu agaghi-ahu kwa ha ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.


Jehova, aka-nri-Gi, nke di ebube n'ike, Jehova, aka-nri-Gi nētipia onye-iro.


Ma Fero agaghi-ege unu nti, M'gētiye kwa akam n'aru ndi Ijipt, were kwa ikpé uku di iche iche me ka usu nile nke ndi-agha nkem, bú ndim umu Israel, si n'ala Ijipt puta.


Ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gēseti akam n'aru ndi Ijipt, me ka umu Israel si n'etiti ha puta.


Nke nēme ka ogwe-aka-Ya mara nma je ije n'aka-nri Moses? Nke nēkewa miri n'iru ha, imere Onwe-ya aha ebighi-ebi?


Jehova we si Moses, Aka Jehova, ọ̀ ghọwo nkpunkpu aka? ub͕u a ka i gāhu ma okwum gērere gi ma-ọbu na ọ gaghi-ere.


N'ihi na ọb͕ub͕a-afa adighi megide Jekob, Iju-ase adighi kwa megide Israel: Na mb͕e ahu ka agēkwu okwu bayere Jekob, baye-kwa-ra Israel, si, Le ihe Chineke meworo!


Chineke nke ndi nka, bú Israel, rọputara nna-ayi-hà, we welie ndi Israel elu mb͕e ha nọ dika ọbìa n'ala Ijipt, O were kwa ogwe-aka di elu duputa ha nime ya.


Ub͕u a, hunu na Mu onwem, Mu onwem bu Ya, Ọ dighi kwa chi ọzọ Mu na ya nọ: Mu onwem nēme ka anwua, M'nēme kwa ka adi ndu; M'tib͕uwo etib͕u, Mu onwem gēme kwa ka aru di ike: Ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam.


Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ nwawo ibà nime otù mba isi n'etiti ya were n'Onwe-ya mba ọzọ, n'ọnwunwa di iche iche, na n'ihe-iriba-ama di iche iche, na n'ihe-ebube di iche iche, na n'agha, na n'aka di ike, na n'ogwe-aka esetiri eseti, na n'oké egwu di iche iche, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-unu, mere unu n'Ijipt n'anya-unu?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan