Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 5:6 - Bible Nso

6 N'ubọ-chi ahu Fero we nye ndi nāchi ndi Israel n'ihe-ike na ndi nēle ha anya n'ọlu iwu, si,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Nʼụbọchị ahụ kwa, Fero nyere ndị nlekọta ụmụ Izrel na ndị o mere ndịisi nʼebe ụmụ Izrel nọ iwu sị,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 5:6
14 Iomraidhean Croise  

Uzaia nwe-kwa-ra usu-ndi-agha ndi nēbu agha, ndi nāpukuru usu-ndi-agha n'usu n'usu, dika ọnu-ọgugu nke ngukọta-ha si di n'aka Jeiel, bú ode-akwukwọ, na Maaseia, bú odozi-okwu, n'okpuru aka Hananaia, otù onye nime ndi-isi eze.


Ha we do ndi-isi nke ndi nēfè òfùfè n'isi ha iwere ibu-ha weda ha ala. Ha we wuere Fero obodo abua ichikobata ihe, bú Paitom na Raamses.


Jehova we si, Ahuwom n'ezie nweda-n'ala nke ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam iti-nkpu-ha n'ihi ndi nāchi ha n'ihe-ike; n'ihi na amawom ihe-nb͕u-ha nile;


Ndi nāchi ndi Israel n'ihe-ike we pua, ha na ndi nēle ha anya n'ọlu, ha we gwa ndi ahu okwu, si, Otú a ka Fero siri, M'gaghi-adi nēnye unu okporo-ọka.


Ndi nēle umu Israel anya n'ọlu we hu ha na ha nọ n'ọnọdu ọjọ mb͕e anāsi, Unu agubìla ihe nime brick-unu, ọlu nke ubọchi n'ubọchi-ya.


Unu enye-kwa-la ndi ahu okporo-ọka ọzọ ikpu brick, dika na mb͕e gara aga: ha onwe-ha gēje chikọtara onwe-ha okporo-ọka.


Onye ezi omume mara ndu anu-ulo-ya: Ma obi-ebere nile nke ndi nēmebi iwu bu enweghi-obi-ebere.


Jehova we si Moses, Chikọtaram ọgu ndikom atọ na iri sitere na ndi-okenye Israel, ndi i maworo na ha onwe-ha bu ndi-okenye nke ndi Israel, na ndi nēle ha anya n'ọlu: gi chiri ha bia rue ulo-ikwū nzute, ka ha we soro gi guzo onwe-ha n'ebe ahu.


M'we chiri ndi-isi ebo nile unu, ndikom mara ihe, ndi ama-kwa-ra aha-ha, m'we do ha ndi-isi-unu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi madu iri madu iri, na ndi-odozi-okwu, dika ebo nile unu si di.


I gēmere onwe-gi ndi-ikpé na ndi-odozi-okwu nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, dika ebo-gi nile si di: ha gēkpe kwa ndi Israel ikpe ezi omume.


Joshua we chikọta ebo nile nke Israel rue Shekem, ọ kpọ ndi-okenye Israel, na ndi-isi-ha, na ndi-ikpé-ha, na ndi-odozi-okwu-ha; ha we guzo onwe-ha n'iru Chineke.


M'we nye Aisak Jekob na Isọ: M'we nye Isọ ugwu Sia, ka ọ nweta ya; ma Jekob na umu-ya ridara n'Ijipt.


Israel nile, na ndi-okenye-ha, na ndi-ọchi-agha-ha, na ndi-ikpé-ha, nēguzo kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke ib͕e ahu na ncherita-iru ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ma ọbìa ma onye amuru n'ala; nkera-ha na ncherita-iru ugwu Geraizim, nkera-ha ọzọ na ncherita-iru ugwu Ibal; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu na mbu, igọzi ndi Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan