Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 5:2 - Bible Nso

2 Fero we si, Ònye bu Jehova, na m'gēge nti n'olu-Ya izipu Israel? amaghm Jehova, ọzọ kwa, m'gaghi-ezipu Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Fero zara sị, “Onye ka Onyenwe anyị bụ m ga-eji gee ntị nʼolu ya ịhapụ ụmụ Izrel ka ha si nʼebe a pụọ? Amaghị m onye ọ bụ, agaghị m ekwekwa ka Izrel gaa ebe ọbụla.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 5:2
25 Iomraidhean Croise  

Òle ndi n'etiti chi nile nke ala dum ka ha bu, bú ndi naputara ala-ha n'akam, na Jehova gānaputa Jerusalem n'akam?


Ọ̀ bu onye n'etiti chi nile nke mba ndia, bú ndi nnam-hà wezugara ka ebibie ha, nke puru inaputa ndi-ya n'akam, na Chineke-unu puru inaputa unu n'akam?


Ma ub͕u a unu ekwela Hezekaia rafue unu, kpali kwa unu otú a, unu ekwe-kwa-la ya: n'ihi na ọ dighi chi ọ bula nke mba ọ bula ma-ọbu ala-eze ọ bula puru inaputa ndi-ya n'akam, ma-ọbu n'aka nnam-hà: n'ezie Chineke-unu agaghi-anaputa kwa unu n'akam.


Ha we kwue okwu bayere Chineke Jerusalem, dika ha si ekwu okwu bayere chi nile nke ndi uwa, bú ọlu aka madu.


I we tiye ihe-iriba-ama na ihe-ebube n'aru Fero, na n'aru ndi-orù-ya nile, na n'aru ndi nile nke ala-ya; n'ihi na I mara na ha were nganga megide ha; I we mere Onwe-gi aha, dika o si di ta.


N'ihi na o setipuwo aka-ya imegide Chineke, Ọ bu kwa imegide Onye Nke puru ime ihe nile ka ọ nēme onwe-ya onye di ike;


Ọ nēwere olu kwesiri ike b͕akwasi Ya, Were kwa ihe-nb͕ochi di ib͕idi nke ọta-ya:


Gini bu Onye Nke puru ime ihe nile, nke ayi gābu orù-Ya? Gini ka ọ gābara ayi, ma ayi riọ Ya aririọ?


Onye nēmebi iwu, ka imi-ya si di elu, nāsi, Ọ dighi ajuju Ọ gāju. Nzube-ya nile nāsi, ọ dighi Chineke ọ bula di.


Ndi siworo, Ayi nēme ire-ayi ka ọ di ike; Eb͕ub͕ere-ọnu-ayi di n'akuku ayi: ònye ka ayi nwere dika onye-nwe-ayi?


N'ihi ipunara ndi ewedara n'ala ihe, n'ihi isu-ude nke ndi-ob͕eye, Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova kwuru; M'gēdo ya na nzọputa nke o nēkusi ume ike inwe.


Onye-nzuzu asiwo n'obi-ya, Ọ dighi Chineke ọ bula di. Ha ebibiwo onwe-ha, ha emewo ka omume-ha buru ihe-árú; Ọ dighi onye nēme ezi ihe.


Ma Mu onwem mara na eze Ijipt agaghi-ekwe unu je, é-è, ọ bughi n'aka di ike.


Otú a ka Jehova siri, Nime nka ka i gāmara na Mu onwem bu Jehova: le, mu onwem gaje iwere nkpa-n'aka nke di n'akam tikwasi miri nke di n'osimiri Nail, ọ gāb͕anwe ghọ ọbara.


Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova? Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori, We were aha Chinekem me ihe ọjọ.


Ma ọ buru na unu onwe-unu asi, Ayi agaghi-ebi n'ala nka; unu ewe ghara ige nti olu Jehova, bú Chineke-unu;


Menu ya ka ọ ṅubiga manya ókè; n'ihi na ọ bu Jehova ka o mere onwe-ya ka ọ di uku megide: Moab gāturu kwa onwe-ya n'ihe ọ b͕ọrọ, ọ gāghọ kwa ihe-ọchì, ọbuná ya onwe-ya.


Ub͕u a asi na unu ejikerewo na mb͕e unu gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, unu gāda n'ala kpọ isi ala nye onyinyo ahu nke m'meworo, ọ di nma: ma asi na unu adighi-akpọ isi ala, n'otù mb͕e ahu ka agātubà unu n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu; ònye bu kwa chi ahu nke gānaputa unu n'akam?


Ihe ndia ka ha gēme kwa, n'ihi na ha amaghi Nnam, ha amaghi kwa Mu.


Dika ha juru inọgide n'imazu Chineke, Chineke ra-kwa-ra ha nye n'aka uche ajuru aju, ime ihe ahu nile nēkwesighi;


nime ọku nēre ere, nābọ̀ ọ́bọ̀ n'aru ndi nāmataghi Chineke, ha na ndi nāṅaghi nti ozi ọma nke Onye-nwe-ayi Jisus:


Ewe chikọta kwa ọb͕ọ ahu nile na ndi bu nna-ha n'ala-mọ: ọb͕ọ ọzọ we bilie inọchi ha, ndi nāmaghi Jehova, ha amaghi kwa omume nke O mere Israel.


Ma umu-ndikom Ilai bu ndi jọb͕uru onwe-ha; ha amaghi Jehova.


Nebal we za ndi-orù Devid, si, Ònye bu Devid? ònye bu kwa nwa Jesi? ọtutu orù di ta ndi nētiwapu onwe-ha, onye ọ bula n'aka onye-nwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan