25 O welie oriọna ahu nile n'iru Jehova; dika Jehova nyere Moses iwu.
25 Ọ mụnyere oriọna ndị ahụ nʼihu Onyenwe anyị dịka Onyenwe anyị si nye nʼiwu.
I gēme kwa oriọna-ya, ha gādi asa: ha gēweli kwa oriọna-ya nile, ka ọ we nye ìhè na ncherita-iru ya.
Ọ dọba ihe-idọba-oriọna ahu nime ulo-ikwū nzute, na ncherita-iru table, n'akuku ebe-obibi ahu chere iru na Ndida.
I gēwebata kwa table ahu, do ihe ya n'usoro; i gēwe-bata kwa ihe-idọba-oriọna ahu, weli kwa oriọna-ya nile.
Gwa Eron okwu, si ya, Mb͕e i nēweli oriọna asa ahu, na ncherita-iru nke iru ihe-idọba-oriọna ka oriọna asa ahu gēnye ìhè.
Eron we me otú a; na ncherita-iru nke iru ihe-idọba-oriọna ahu ka o weliri oriọna-ya nile, dika Jehova nyere Moses iwu.
Àmùmà na olu na éb͕è-elu-igwe nēsi kwa n'oche-eze ahu puta. Ọwa nke ọku asa nēnwu n'iru oche-eze ahu, nke bu Mọ asa ahu nke Chineke;