Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 40:20 - Bible Nso

20 O were ihe-àmà ahu tiye n'ib͕e ahu, tukwasi nkpa-n'aka-ya abua n'ib͕e ahu, tiyekwasi ebe-nkpuchi-nmehie n'ib͕e ahu n'elu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 O tinyere Ihe Ama nʼime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Emesịa, ọ tụkwasịkwara mkpara e ji ebu igbe ahụ nʼakụkụ igbe ahụ, were okwuchi igbe ahụ, nke bụ Oche Ebere ahụ, kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 40:20
19 Iomraidhean Croise  

Ọ dighi ihe di n'ib͕e ahu, ọ bu nání mbadamba nkume abua nke Moses dọbara n'ebe ahu na Horeb, mb͕e Jehova na umu Israel b͕ara ndu, mb͕e ha siri n'ala Ijipt puta.


Devid we kpọkọta Israel nile ibiaru Jerusalem, ibugota ib͕e Jehova rue ọnọdu-ya, nke o doziri nye ya.


Ọ dighi ihe di n'ib͕e ahu, ọ bu nání mbadamba nkume abua nke Moses tiyere nime ha na Horeb, mb͕e Jehova na umu Israel b͕ara ndu, mb͕e ha siri n'Ijipt puta.


Ime ihe di Gi utọ atọwom utọ, Chineke; Iwu-Gi di kwa nime obim.


Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka Eron dọbara ya n'iru Ihe-àmà, ka ọ buru ihe-ndebe.


I gētiye kwa ebe-nkpuchi-nmehie ahu n'elu ib͕e ihe-àmà nime ebe nsọ ahu kachasi ebe nsọ nile.


Mb͕e Ọ kpayesiri Moses uka n'ugwu Sainai, O we nye ya mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu, bú mbadamba nkume, nke ewere nkpisi-aka Chineke de ihe n'elu ha.


Ọ we b͕asa ulo-ikwū ahu n'elu ebe-obibi ahu, tukwasi ya ihe-nkpuchi nke ulo-ikwū ahu n'elu; dika Jehova nyere Moses iwu.


I gādọba kwa n'ebe ahu ib͕e ihe-àmà ahu, i gēji kwa ákwà-nb͕ochi ahu kwuchi ib͕e ahu.


Ma Jisus zara, si ya, Kwerem ub͕u a: n'ihi na otú a ka ọ kwesiri ayi imezu ezi omume nile. Mb͕e ahu o kwere Ya.


N'ihi na Kraist bu nsọtu iwu iwetara onye ọ bula nke kwere ezi omume.


Onye Chineke chere n'iru ọra madu ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi, site n'okwukwe ekwere n'ọbara-Ya, igosi ezi omume-Ya, n'ihi nb͕aghara nmehie nile emehiereri n'oge gara aga, n'oge nnagide nke Chineke;


M'we chigharia si n'ugwu ahu rida, tiye mbadamba nkume ahu nime ib͕e ahu nke m'mereri; ha di kwa n'ebe ahu, dika Jehova nyerem iwu.


Ya mere ka ayi were nkwuwa-okwu biarue oche-eze amara, ka ewe mere ayi ebere, ka ayi we hu kwa amara iyere ayi aka n'oge nkpà.


nke nwere ebe-ichu-àjà ọla-edo isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke amachitara ọla-edo gburugburu n'akuku nile, nke ite ọla-edo nke nwere manna di nime ya, ya na nkpa-n'aka ahu nke Eron nke mara ifuru, na mbadamba nkume abua nke ọb͕ub͕a-ndu ahu;


Ya onwe-ya bu kwa ihe ijuru Chineke obi bayere nmehie nile ayi; ma Ọ bughi ihe ijuru Ya obi bayere nání nmehie nke ayi onwe-ayi, kama Ọ bu kwa ihe ijuru Ya obi bayere nmehie nke uwa dum;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan