Ọ were miri sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya; Moses we sure ebulu ahu nile ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku ka ọ bu ibu ihe ísì utọ: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu; dika Jehova nyere Moses iwu.
Ọ tukwasi ákwà-nkukù-isi n'isi-ya; tukwasi kwa n'ákwà-nkukù-isi ahu, n'iru ya, ihe ahu di mbara nke ọla-edo, bú okpu nsọ nke onye-nchu-àjà; dika Jehova nyere Moses iwu.
Ma asi na ọ bu ubọchi abua, ma-ọbu otù ọnwa, ma-ọbu otù arọ, ka igwe-oji ahu nānọgide n'elu ebe-obibi ahu, ibi n'elu ya, umu Israel nānọdu n'ọmuma-ulo-ikwū-ha, ha ebulighi kwa ije: ma mb͕e emere ka ọ rigo, ha buliri ije.
Ma ub͕u a, Israel, ge nti ukpuru nile, ge kwa nti ikpé nile, nke mu onwem nēzí unu, ime ha; ka unu we di ndu, we ba, nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nēnye unu.