Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 40:15 - Bible Nso

15 i gēte kwa ha manu, dika i tere nna-ha, ka ha we burum ndi-nchu-àjà: otite-manu-ha aghaghi iburu ha ọlu-nchu-àjà ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Tee ha mmanụ dịka i si tee nna ha, ime ka ha bụrụ ndị na-ejere m ozi dịka ndị nchụaja. Otite mmanụ ha ga-abụ nye ọrụ nchụaja ha nke ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 40:15
15 Iomraidhean Croise  

Jehova aṅuwo iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya, Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi Dika usoro Melkizedek si di.


Ubọchi a gāburu unu ihe-ncheta, unu gēme kwa ya ka ọ buru ememe unu nēmere Jehova: n'ọb͕ọ nile unu ka unu ganēme ya ka ọ buru ememe site n'ukpuru ebighi-ebi.


I gēyi-kwasi ha n'aru Eron, bú nwa-nne-gi, na n'aru umu-ya ndikom tiyere ya; i gēte kwa ha manu, meju aka-ha, do ha nsọ, ka ha we burum ndi-nchu-àjà.


I gēwere kwa ihe ike n'úkwù ke ha, bú Eron na umu-ya ndikom, i gēke kwa ha ihe ike n'isi: ha gēnwe kwa ọlu nchu-àjà site n'ukpuru ebighi-ebi: i gēmeju kwa aka Eron na aka umu-ya ndikom.


I gāgwa kwa umu Israel okwu, si, Manu otite-manu di nsọ ka nka gāburum rue ọb͕ọ-unu nile.


Onye ọ bula nke gāsugwa nke di ka ya, ma-ọbu onye ọ bula nke gēwere ufọdu nime ya tiye n'aru onye ala ọzọ, agēbipu ya n'etiti umu-nna-ya.


Ọ bu kwa umu-ya ndikom ka i gēme ka ha biarue nso, i gēyikwasi kwa ha uwe-ime:


Moses we me ya: dika ihe nile si di nke Jehova nyere ya n'iwu, otú a ka ọ mere.


Ọ si, Ndia bu umu-ndikom abua nke manu ọhu, ndi nēguzo n'akuku Onye-nwe uwa nka nile.


ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya, ọb͕ub͕a-ndu ọlu-nchu-àjà ebighi-ebi; n'ihi na o kworo ekworo bayere Chineke-ya, kpuchi-kwa-ra umu Israel nmehie-ha.


enweghi nna, enweghi nne, enweghi akukọ osuso-ọmumu, enweghi nmalite ubọchi ma-ọbu ọgwugwu ndu, ma emewo ya ka o yie Ọkpara Chineke), ọ nānọgide onye-nchu-àjà mb͕e nile.


Ma apughi ikwugide nka okwu ọ bula na onye ka nma nāgọzi onye dikariri ntà.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan