Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 4:27 - Bible Nso

27 Jehova we si Eron, Jerue ọzara izute Moses. Ọ we je, zute ya n'ugwu Chineke, sutu ya ọnú.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Ugbu a, Onyenwe anyị gwara Erọn okwu sị, “Gaa nʼime ọzara ka izute Mosis.” Erọn gara jekwuru Mosis nʼugwu Horeb, ugwu Chineke, sutu ya ọnụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 4:27
15 Iomraidhean Croise  

Jekob we sutu Rechel ọnu, welie olu-ya, kwa ákwá.


O we bilie, rie ihe, ṅu kwa miri, je n'ike ihe-oriri ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali rue ugwu Chineke, bú Horeb.


O zigara Moses, bú orù-Ya, Na Eron onye Ọ rọputara.


Jetro, bú nna nwunye Moses, we biakute Moses, ya na umu-ya ndikom na nwunye-ya, nime ọzara ebe ya onwe-ya maworo ulo-ikwū, n'ugwu nke Chineke.


Moses we pua izute nna nwunye-ya, we kpọ isi ala, sutu kwa ya ọnu; ha we jurita onwe-ha ma ha nọ n'udo; ha we ba n'ulo-ikwū.


Moses we rigokuru Chineke, Jehova we si n'ugwu ahu kpọ ya òkù, si, Otú a ka i gāsi ulo Jekob, gosi kwa umu Israel;


Ndi Israel nile we nāhu éb͕è-elu-igwe nile, na ire-ọku nile, na olu opì-ike ahu, na ugwu ahu ka ọ nākwu anwurù: mb͕e ndi ahu huru ya ha we ṅaghari, guzo n'ebe di anya.


Moses we bilie, ya na Joshua onye nējere ya ozi: Moses we rigo n'ugwu nke Chineke.


Ma Moses nāzù ìgwè ewu na aturu nke Jetro, bú nna nwunye-ya, bú onye-nchu-àjà Midian: ọ we duru ìgwè ewu na aturu ahu ga n'azu ọzara, ọ we biarue ugwu nke Chineke, rue Horeb.


Ọ we rapu ya ndu. Mb͕e ahu Zipora siri, Di nke ọbara ka i bu, bayere obibì-úgwù.


Abua di nma kari otù; n'ihi na ha nwere ezi ugwọ-ọlu nime ndọb͕u ha nādọb͕u onwe-ha n'ọlu.


Ma bilie, rida, so ha ga, enweghi uche abua: n'ihi na Mu onwem ezitewo ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan