Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 4:14 - Bible Nso

14 Iwe Jehova we di ọku n'aru Moses, Ọ we si, Ọ̀ nọghi, bú Eron nwa-nne-gi, bú onye Livai? amawom na ya onwe-ya nēkwu okwu nke-ọma. Ọzọ kwa, le, ya onwe-ya nāputa izute gi: ma mb͕e ọ huru gi, ọ gāṅuri n'obi-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Onyenwe anyị were iwe dị ọkụ megide Mosis sị ya, “Kedụ maka nwanne gị nwoke Erọn onye Livayị, amaara m na ọ bụ onye ọka okwu. Lee, ọ na-abịa izute gị. Ọ ga-aṅụrị ọṅụ mgbe ọ chọtara gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 4:14
19 Iomraidhean Croise  

Iwe Jehova we di ọku megide Uza; Chineke we tib͕ue ya n'ebe ahu n'ihi nmehie-ya; o we nwua n'ebe ahu n'akuku ib͕e Chineke.


Jehova we wesa Solomon iwe, n'ihi na ewezugara obi-ya n'ebe Jehova nọ, bú Chineke Israel, Onye mere ka ọ hu Ya anya ub͕ò abua,


Ọ we jọ njọ n'anya Chineke bayere okwu a, O we tib͕ue Israel.


O zigara Moses, bú orù-Ya, Na Eron onye Ọ rọputara.


Ma ọ siri, Biko, Onye-nwe-ayi, biko, zìe n'aka onye I gēziga.


Ọ bu kwa nkpa-n'aka nka ka i gēwere n'aka-gi, nke i gēji me ihe-iriba-ama ndia.


Jehova we si Eron, Jerue ọzara izute Moses. Ọ we je, zute ya n'ugwu Chineke, sutu ya ọnú.


Ha we si, Ọ̀ bu ezie na nání Moses ka Jehova wereworo kwue okwu? Ọ̀ bughi kwa ayi ka o wereworo kwue okwu? Jehova we nu ya.


N'ihi na ọ di Mọ Nsọ nma, di kwa ayi onwe-ayi nma, ka ayi ghara ibo unu ibu arọ́ kari ihe ndia di nkpà:


mọm adighi nfé ma-ọli, n'ihi na ahughi m Taitọs nwa-nnam: kama ekelerem ha ekele ikpe-azu, we pua je Masedọnia.


N'ihi na ha nile nāchọ ihe nke aka ha, ọ bughi ihe nke Jisus Kraist,


M'we ziga Moses na Eron, tie Ijipt ihe, dika ihe ahu si di nke M'mere n'etiti ya: emesia M'we me ka unu puta.


Mb͕e Jekob batara n'Ijipt, mb͕e nna-unu-hà tikuru Jehova nkpu, Jehova we zite Moses na Eron, ndi mere ka nna-unu-hà si n'Ijipt puta, me kwa ka ha biri n'ebe a.


Onye nke Chineke we biakwute Ilai, si ya, Otú a ka Jehova siri, Èkpugherem onwem n'ezie nye ulo nna-gi, mb͕e ha nọ n'Ijipt buru orù nye ulo Fero?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan