Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 39:32 - Bible Nso

32 Ewe me ka òfùfè nile nke ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute gwusia: umu Israel we me dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu, otú a ka ha mere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Otu a ka ha si rụchaa ọrụ iwu ụlọ nzute ahụ. Ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị si nye Mosis nʼiwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 39:32
24 Iomraidhean Croise  

Ma n'arọ nke-iri-na-otù, n'ọnwa Bul, nke bu ọnwa nke-asatọ, ka ewusiri ulo ahu n'ihe-ya nile na n'ikpé-ya nile. O we nọ arọ asa n'iwu ya.


Hairam me-kwa-ra ite ọsisa-miri nile, na osekè nile, na ọkwa-nwusa nile. Hairam we jebìe ozi nile nke o jere eze, bú Solomon, n'ulo Jehova:


Ihe a nile ka Jehova were odide-akwukwọ me ka m'mata site n'aka-Ya n'arum, ka Devid kwuru, bú ije-ozi nile nke ihe-atù a.


Umu Israel we je me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere.


Ma le anya ka i me ha dika ihe-atù-ha si di, nke anēme ka gi onwe-gi hu n'ugwu a.


ulo-ikwū nzute, na ib͕e nke diri ihe-àmà ahu, na ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ya, na ihe nile nke Ulo-ikwū ahu;


Ha tiye-kwa-ra n'elu ya eriri-nma ogho anunu, itiye ya n'elu ákwà-nkukù-isi ahu n'elu; dika Jehova nyere Moses iwu.


Ha we butere Moses ebe-obibi ahu, Ulo-ikwū ahu, na ihe-ya nile, nko-ya nile, na ibo-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile;


Jehova we gwa Moses okwu, si,


I gādọba kwa n'ebe ahu ib͕e ihe-àmà ahu, i gēji kwa ákwà-nb͕ochi ahu kwuchi ib͕e ahu.


mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, na mb͕e ha nābiaru ebe-ichu-àjà nso, ha we sa aru: dika Jehova nyere Moses iwu.


Ihe-ndebe-ha bu ib͕e ahu, na table ahu, na ihe-idọba-oriọna, na ebe-ichu-àjà abua, na ihe nile nke ebe nsọ ahu nke ha ji je ozi na ákwà-nkwuchi ahu, na òfùfè-ya nile.


nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.


Ihe ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu, nke ahu ka unu gēlezi anya ime: atukwasila ihe n'elu ya, agubì-kwa-la ihe nime ya.


na ọbu onye kwesiri ntukwasi-obi n'ebe Onye ahu nọ, bú Onye mere Ya ka Ọ buru Onye-ozi na Onye-isi-nchu-àjà, dika Moses di kwa n'èzi-na-ulo-Ya dum.


ndi-nchu-àjà ndi nēkpe ekpere nime ihe-nṅomi na onyinyo nke ebe di n'elu-igwe, dika Chineke duworo Moses ọdú mb͕e ọ gaje imazu ulo-ikwū ahu: n'ihi na Ọ nāsi, Le anya ka i me ihe nile dika ihe-atù ahu si di nke egosiri gi n'ugwu.


Samuel we si, Àjà-nsure-ọku na àjà ọzọ, hà nātọ Jehova utọ dika ige nti olu Jehova? Le, ige nti di nma kari ichu àjà, iṅa nti di nma kari abuba ebulu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan