Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 38:3 - Bible Nso

3 O me-kwa-ra ihe nile nke ebe-ichu-aja ahu, bú ite-ya nile, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya nile, na ndudu-ya nile, na ihe-igu-ọku-ya nile: ihe-ya nile ka o ji ọla me.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ha ji bronz kpụọ ngwongwo niile dị iche iche, ya bụ efere ikpofu ntụ, shọvel ya niile, efere ịkwọsa mmiri niile, ngaji eze ịdụta anụ na efere ndị e ji agụ ọkụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 38:3
6 Iomraidhean Croise  

Na ite nile, na osekè nile, na ndudu nile, na ihe-ha nile, ndia ka Huram nna-ya mere eze, bú Solomon, bayere ulo Jehova, ha bu ọla echichara echicha.


O me-kwa-ra oké osimiri awuru awu, cubit iri site n'otù ọnu-ya rue ọnu-ya nke-ọzọ, ọ di buruburu buruburu, cubit ise ka idi-elu-ya di; eriri nke orú cubit na iri b͕a-kwa-ra ya buruburu.


I gēme kwa ite-ya nile inara ntu-ya, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya nile, na ndudu-ya nile, na ihe-igu-ọku-ya nile: ọbuná ihe-ya nile ka i geji ọla me.


O me-kwa-ra mpi-ya n'elu nkuku anọ ya; mpi-ya sitere na ya: ọ machita ya ọla.


O we mere ebe-ichu-àjà ahu ihe-ọkpukpa, ihe eji ub͕u ọla me, n'okpuru ebe dipuru adipu buruburu ya n'okpuru, rue na nkera-ya.


Ikpe ekpere banyere ndi-nchu-àjà n'ebe ndi Israel nọ bu nka, mb͕e nwoke ọ bula nāchu àjà, nwa-okorọbia nke onye-nchu-àjà we bata, mb͕e anēsi anu, nduri nke wara ezé atọ di n'aka-ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan