Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 38:27 - Bible Nso

27 Ọgu talent ọla-ọcha ise ahu we buru iwu ukwu nile nke ibo nke ebe nsọ ahu, na ukwu nile nke ide nke ákwà-nb͕ochi ahu; ọgu ukwu ise ka ọgu talent ise ahu nwere, otù talent diri otù ukwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Ịdị arọ nke ọlaọcha niile e ji rụọ ụkwụ ibo niile nke ebe nsọ ahụ, na ụkwụ ogidi niile e ji jidesie akwa mgbochi ndị ahụ ike bụ puku kilogram atọ, na narị kilogram isii. Ịdị arọ nke ọlaọcha e ji wuo ụkwụ ọbụla bụ iri kilogram atọ na isii.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 38:27
6 Iomraidhean Croise  

Ọgu ukwu ọla-ọcha abua ka i gēme kwa n'okpuru orú ibo ahu; ukwu abua n'okpuru otù ibo inara ihe-nhiọye-ya abua, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ inara ihe-nhiọye-ya abua.


na ọgu ukwu ọla-ọcha ha abua; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.


Ha gādi kwa ibo asatọ, na ukwu ọla-ọcha ha, ukwu iri na isi; ukwu abua n'okpuru otù ibo, ukwu abua kwa n'okpuru ibo ọzọ.


i gētiye ya n'elu ide acacia anọ amachitara ọla-edo, nkpọye-ha gābu ọla-edo, n'elu ukwu ọla-ọcha anọ.


otù beka otù isi, ya bu nkera shekel, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, enyere n'isi onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtara agukọta nọ, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, n'isi orú nnù ọgu uzọ atọ na uzọ iri-na-ise, na nnù asatọ, na ọgu iri-na-asa, na iri.


Nnù shekel anọ na ọgu asatọ na iri na ise ahu ka o ji kwa mere ide ahu nile nkpọye, machita kwa isi-ha, mekwara ha ihe-ngegide.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan