N'ubọchi ahu ka eze doro etiti ogige nke di n'iru ulo Jehova nsọ; n'ihi na ọ churu àjà-nsure-ọku na onyinye-inata-iru-ọma na abuba àjà-udo n'ebe ahu: n'ihi na ebe-ichu-àjà ọla nke di n'iru Jehova di ntà kari inagide àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, na abuba àjà-udo.
Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, nke ulo Zedok, we gwa ya, si, Site na mb͕e ha malitere ibubata àjà-nbuli n'ulo Jehova, ayi erijuwo afọ, rifọ kwa ihe n'uba: n'ihi na Jehova agọziwo ndi-Ya; ma nke fọduru bu ọtutu ihe nile a.
Moses we nye iwu, ha we me ka ekwusa ya n'ọmuma-ulo-ikwū nile, si, Nwoke ma-ọbu nwayi, ka ha ghara ije ozi ọzọ bayere àjà-nbuli nke ebe nsọ ahu. Ewe me ka ndi Israel wetabìe ihe.