Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 34:9 - Bible Nso

9 Ọ si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, Onye-nwe-ayi, biko, ka Onye-nwe-ayi nēje n'etiti ayi; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka ayi bu; Gi b͕aghara kwa ajọ omume-ayi na nmehie-ayi, keta kwa ayi n'ihe-nketa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 sị ya, “Ọ bụrụ nʼezie na m achọtala ihuọma nʼanya gị, Onyenwe m, ka Onyenwe m, biko soro anyị gaa. Ọ bụ ezie na ndị a bụ ndị isiike, gbaghara anyị ajọ omume anyị, na mmehie anyị niile, ka ị nabatakwa anyị dịka ndị nke gị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 34:9
23 Iomraidhean Croise  

N'ihi na Jekob ka Ja rọputaworo nye Onwe-ya, Ọ rọputara Israel ka ọ buru ihe nke aka Ya.


N'ihi aha-Gi, Jehova, B͕aghara ajọ omumem, n'ihi na o riri nne.


Zọputa ndi-Gi, gozi kwa ihe-nketa-Gi: Nāzù kwa ha dika aturu, nēku kwa ha n'aka-Gi rue mb͕e ebighi-ebi.


Mba ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú mba ahu nke Jehova bu Chineke-ya; Bú ndi ahu Ọ rọputara iburu Ya ihe-nketa.


O mechibido-kwa-ra ndi-Ya nye n'aka mma-agha; Ọ bu kwa ihe-nketa-Ya ka O webigara iwe-ókè megide.


N'ihi na Jehova agaghi-ara ndi-Ya aka, Ọ gaghi-arapu kwa ihe-nketa-Ya.


Ma ub͕u a, ọ buru na unu ege nti n'olum n'ezie, ọ buru kwa na unu edebe ọb͕ub͕a-ndum, unu gābu-kwa-ram ihe nke akam kari ndi nile: n'ihi na ọ bu Mu nwe uwa nile:


Jehova si-kwa-ra Moses, Ahuwom ndi nka, ma, le, ndi kwesiri olu ike ka ọ bu:


Moses we si Jehova, Le, Gi onwe-gi nāsim, Me ka ndi nka rigota: ma Gi onwe-gi emeghi ka M'mara onye I gēziga ka mu na ya yikọ je. Ma Gi onwe-gi asiwo, Amawom i n'aha, ọzọ kwa, i hutawo amara n'irum.


Onye nēdebere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nāb͕aghara ajọ omume na njehie na nmehie: ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu umu, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ.


N'ihi na M'mara na onye siri ike ka i bu, na ọ bu akwara ígwè ka olu-gi bu, na egedege-iru-gi bu kwa ọla;


Ọ bughi dika ihe ndia ka Òkè Jekob bu; n'ihi na onye nākpu ihe nile ka Ọ bu; Israel bu kwa ebo nke ihe-nketa-Ya: Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


Ònye bu Chineke dika Gi, Nke nēbupu ajọ omume, nāgabiga kwa njehie nke diri ndi ala-nketa-Ya fọduru? O jigideghi iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na onye ebere nātọ utọ ka Ọ bu.


Jehova gēketa kwa Juda n'òkè-Ya n'elu ala nsọ a, rọputa kwa Jerusalem ọzọ.


Biko, b͕aghara ajọ omume nke ndi nka dika idi-uku nke ebere-Gi si di, na dika I b͕agharaworo ndi nka, site n'Ijipt we rue ub͕u a.


nēzí ha ka ha debe ihe nile, ka ha ra, bú nke M'nyere unu n'iwu: ma le, Mu onwem nọyere unu ubọchi nile, rue ọgwugwu oge a.


N'ihi na òkè Jehova bu ndi-Ya; Jekob bu akuku ihe-nketa-Ya.


Ma Jehova ewerewo unu, me ka unu si n'oké ọku ígwè ahu, bú Ijipt, puta, iburu Ya ndi nketa, otú ọ di ta.


M'we turu onwem n'ala n'iru Jehova, dika na mbu, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri m'riri, ọ dighi kwa miri m'ṅuru; n'ihi nmehie-unu nile nke unu mehiere, n'ime ihe ọjọ ahu n'anya Jehova, ikpasu Ya iwe.


M'we kpere Jehova, si, Onye-nwe-ayi Jehova, ebibila ndi-Gi na ihe-nketa-Gi, nke I b͕aputaworo n'idi-uku-Gi, nke I wereworo aka di ike me ka o si n'Ijipt puta.


Ma ha onwe-ha bu ndi-Gi na ihe-nketa-Gi, ndi I were ike uku Gi na ogwe-aka-Gi eseteri eseti me ka ha puta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan