Ọpụpụ 34:7 - Bible Nso7 Onye nēdebere nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri ọtutu ub͕ò ebere, Onye nāb͕aghara ajọ omume na njehie na nmehie: ma ọ dighi uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpe nāmaghi; Ọ nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu umu, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a7 Onye na-egosi ịhụnanya ya nye imerime puku, ma na-agbaghara ajọ omume na nnupu isi, na mmehie. Ma ọ dịghị ahapụ ka onye ikpe mara laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ na ụmụ ụmụ ha ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ.” Faic an caibideil |
Ma ub͕u a, Chineke-ayi, Chineke uku, Nke bu dike, Nke di kwa egwu, Gi Onye nēdebe ọb͕ub͕a-ndu na ebere, ka ike-ọgwugwu nile ghara idi ntà n'iru Gi, bú nke gwuworo ayi, gwu kwa ndi-eze-ayi, gwu kwa ndi-isi-ayi, gwu kwa ndi-nchu-àjà-ayi, gwu kwa ndi-amuma-ayi, gwu kwa nna-ayi-hà, gwu kwa ndi-Gi nile, site n'ubọchi ndi-eze Asiria rue ta.