Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 34:5 - Bible Nso

5 Jehova we ridata n'igwe-oji, o guzo onwe-ya n'ebe Ọ nọ n'ebe ahu, we kpọkue aha Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị rịdatara nʼime ogidi igwe ojii, guzo nʼihu Mosis, kwupụta aha ya bụ Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 34:5
16 Iomraidhean Croise  

Ka ha we kọ akukọ aha Jehova nime Zaion, Kọ kwa akukọ otuto-Ya nime Jerusalem;


Ugwu Sainai nile nākwu anwurù, n'ihi na Jehova ridakwasiri ya n'ọku: anwurù-ya we kwugo dika anwurù nke oké ọku, ugwu ahu nile we ma jijiji nke-uku.


Jehova we si Moses, Le, Mu onwem nābiakute gi n'igwe-oji b͕ara ọchichiri, ka ndim we nu mb͕e M'nākpa-yere gi uka, ọzọ kwa, ka ọ we buru gi onwe-gi ka ha gēkwere rue mb͕e ebighi-ebi. Moses we gosi Jehova okwu nile nke ndi Israel.


Lezie anya n'iru ya, ge kwa nti n'olu-ya; enupula isi n'okpuru ya: n'ihi na ọ gaghi-ab͕aghara njehie-unu; n'ihi na aham di nime ya.


Ọ si, Mu onwem gēme ka idi-nmam nile gabiga n'iru gi, M'gākpọ kwa òkù bayere aha Jehova n'iru gi: M'gēme-kwa-ra onye ahu amara, bú onye M'gēmere amara, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru onye ahu nke M'gēnwe obi-ebere n'aru ya.


O rue, mb͕e Moses batara n'Ulo-ikwū ahu, na ogidi igwe-oji ahu ridatara, guzo n'ọnu-uzọ nke Ulo-ikwū: Jehova we gwa Moses okwu.


Ulo-elu di ike ka aha Jehova bu: Nime ya ka onye ezi omume nāb͕abà, o we nọ n'elu.


Nurunu okwu Jehova, unu ndi-ikpe Sọdọm; ṅanu nti n'iwu Chineke-ayi, unu ndi Gọmọra.


M'gāridata, kpayere gi uka n'ebe ahu M'gānara kwa ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasi gi, tukwasi ha; ha gēso kwa gi bū ibu ndi Israel, ka i we ghara ibū ya, nání gi onwe-gi.


Jehova we ridata n'igwe-oji ahu, gwa ya okwu, nara ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasiri ya, tiyekwasi n'ọgu ndi-okenye atọ na iri ahu: o rue, mb͕e Mọ ahu bekwasiri ha, na ha buru amuma, ma ha emeghi ya ọzọ.


Jehova we ridata n'ogidi igwe-oji, guzo n'ọnu-uzọ Ulo-ikwū, kpọ Eron na Miriam: ha abua we puta.


Ma ub͕u a, biko, ka ike Onye-nwe-ayi di uku, dika I kwuworo, si,


N'ihi na aha Jehova ka m'gākpọsa: Nyenu Chineke-ayi idi-uku.


Samuel we gosi ya okwu ahu nile, ọ dighi kwa ihe o zonariri ya. O we si, Jehova ka ọ bu: Ya me ihe di nma n'anya-Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan