Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 34:12 - Bible Nso

12 Lezie onwe-gi anya, ka gi na ndi bi n'ala nke gi onwe-gi nābà nime ya ghara ib͕a ndu, ka ọ we ghara ibu ọnyà n'etiti gi:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Kpacharanụ anya ka unu na ndị bi nʼala ahụ unu na-aba nʼime ya ghara ịgba ndụ. Ka ha ghara ị bụ ihe ịma nʼọnya nʼetiti unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 34:12
15 Iomraidhean Croise  

bú ndi sitere na mba ndi Jehova siri umu Israel, Unu abala n'etiti ha, ndi ahu aba-kwa-la n'etiti unu: n'ezie ha gēwezuga obi-unu ka o so chi nile ha: ndi ahu ka Solomon rapara n'ihu-n'anya.


Ha guzo-kwa-ra ogidi na Asherim nye onwe-ha n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula:


Ha we rapu ulo Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, we fè Asherim na arusi òfùfè: iwe we dikwasi Juda na Jerusalem n'ikpe-ọmuma-ha nka.


Ha we fè arusi nile ha òfùfè; Arusi ahu we ghọrọ ha ọnyà:


unu gānapu kwa n'aka ndi nile bi n'ala ahu ala-ha n'iru unu, unu gāla kwa nkume-ha nile nke emere ka ha yie ihe n'iyi, onyinyo-ha nile awuru awu ka unu gāla kwa n'iyì, me kwa ka ebe di elu nile tọb͕ọrọ n'efu.


ka ha we ghara izí unu ime dika ihe-árú-ha nile si di, nke ha meworo chi nile ha; unu ewe mehie megide Jehova, bú Chineke-unu.


Jehova gāra kwa ha nye n'iru unu, unu gēme kwa ha dika ihe nile enyere n'iwu si di, nke m'nyeworo unu n'iwu.


I gēripia kwa ndi ahu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi; anya-gi agaghi-emere ha ebere: efè-kwa-la chi-ha di iche iche òfùfè; n'ihi na ọnyà ka ọ gāburu gi.


mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gāra kwa ha nye n'iru gi, i we tib͕ue ha; i gēwezugasi kwa ha ka ebibie ha; gi na ha ab͕ala ndu, eme-kwa-la ha amara:


Ndikom Israel we si ndi-Haivait, Eleghi anya n'etiti ayi ka unu onwe-unu nēbi; àyi na unu gēsi kwa aṅa b͕a ndu?


M'we si unu, Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu; unu atula egwu chi nile nke ndi-Amorait, ndi unu onwe-unu bi n'ala-ha: ma unu egeghi nti olum.


Gideon we me ya ka ọ buru ephod, guzo ya ọtọ n'obodọ-ya, bú Ọfra: Israel nile we soro ya nākwa iko n'ebe ahu: o we ghọrọ Gideon, ghọ-kwa-ra ulo-ya, ọnyà.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan