Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 33:7 - Bible Nso

7 Ma Moses nēwere ulo-ikwū ahu, nāmara onwe-ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, n'ebe di anya site n'ọmuma-ulo-ikwū ahu; ọ we kpọ ya, Ulo-ikwū nzute. O rue, na onye ọ bula nke nāchọ Jehova nāpu je ulo-ikwū nzute ahu nke di n'azu ọmuma-ulo-ikwū.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Nʼoge a, Mosis na-ewere ụlọ ikwu manye nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ọ na-akpọ ya ụlọ nzute. Ọ na-amanye ya nʼebe dị anya site nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Onye ọ bụla nke chọrọ ịjụta Onyenwe anyị ase, na-apụ, gaa nʼụlọ nzute ahụ nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 33:7
17 Iomraidhean Croise  

Oké unwu we di n'ubọchi Devid arọ atọ n'usoro, arọ na arọ; Devid we chọ iru Jehova. Jehova we si, Ọ bu n'ihi Sọl na n'ihi ulo ọbara ya, n'ihi na o mere ka ndi Gibeon nwua.


Jehova, n'ìhi gini ka I nēguzo nēbe di anya? N'ìhi gini ka I nēzobe Onwe-gi na mb͕e nile nke nkpà?


Gi ka obim siworo, Gi kwuru okwu, si, Chọnu irum; Iru-Gi, Jehova, ka m ga-achọ.


I huwo ya, Jehova; ab͕ala nkiti: Onye-nwe-ayi, anọlam n'ebe di anya.


Jetro, bú nna nwunye Moses, we were àjà-nsure-ọku na àjà di iche iche ichuru Jehova: Eron we bia, ya na ndi-okenye nile nke Israel, iso nna nwunye Moses ri nri n'iru Chineke.


Moses we pua izute nna nwunye-ya, we kpọ isi ala, sutu kwa ya ọnu; ha we jurita onwe-ha ma ha nọ n'udo; ha we ba n'ulo-ikwū.


Umu Israel we napusi onwe-ha ihe-ichọ-nma-ha nile site n'ugwu Horeb gaba.


O rue, mb͕e Moses puru ije Ulo-ikwū ahu, na ndi Israel nile biliri, guzo onwe-ha ọtọ, nwoke ọ bula n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū-ya, nēlegide Moses anya n'azu, rue mb͕e ọ bara n'Ulo-ikwū ahu.


Jehova di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ: Ma ekpere ndi ezi omume ka Ọ nānu.


kama ajọ omume nile unu aghọwo ihe nākpa ókè n'etiti unu na Chineke-unu, nmehie nile unu ezonariwo kwa unu iru-Ya, O we ghara inu.


E, ọ buru na ha azulite umu-ha, ma M'gāb͕aba ha aka nwa, madu ọ bula ewe ghara idi: e, ahuhu di-kwa-ra ha mb͕e M'gēsi n'aru ha wezuga Onwem!


Ma asi na i si n'ebe ahu chọ Jehova, bú Chineke-gi, i gāchọta kwa Ya, mb͕e i were obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile jua ase Ya.


Onye nēfè òfùfè n'ebe nsọ ahu, na n'ezi ulo-ikwū ahu, nke Onye-nwe-ayi mara, ọ bughi madu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan