23 M'gēwezuga kwa ọbu-akam, i gāhu kwa azum anya: ma agaghi-ahu irum anya.
23 Emesịa, aga m eweli aka m, ka i nwee ike ịhụ azụ m anya, ma ị pụghị ịhụ ihu m.”
Ì gēsi n'ogwugwu chọputa Chineke? Ì gāchọputa Onye Nke puru ime ihe nile rue ebe Ọ sọturu?
Le, ndia bu nání nsọtu uzọ-Ya nile: Le kwa otú ọ di ntà, bú ntakwu okwu anuworo bayere Ya! Ma éb͕è-elu-igwe nke idi-ike-Ya nile, ònye gāghọta ya?
Ọ si kwa, I pughi ihu irum anya: n'ihi na madu agaghi-ahum anya, di kwa ndu.
Ọ dighi onye ọ bula huworo Chineke mb͕e ọ bula; Chineke, bú Ọkpara amuru nání Ya, Onye nādabere n'obì Nna-Ya, Onye ahu kọrọ Ya nye madu.
N'ihi na ub͕u a ayi ji enyo hu ihe, nime ilu; ma mb͕e ahu ayi gāhu iru na iru: ub͕u a m'mara na nkpirikpi; ma mb͕e ahu m'gāmazu dika amazu-kwa-ram.
Onye nání Ya nwere anwughi-anwu, nēbi nime ìhè nke anāpughi ibiaru nso; Onye ọ dighi madu ọ bula huworo Ya anya, ma-ọbu pu ihu Ya anya: Onye nsọpuru na ike ebighi-ebi diri. Amen.