Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 32:5 - Bible Nso

5 Eron we hu ya, we wue ebe-ichu-àjà n'iru ya; Eron we kpọ òkù, si, Ememe ka agēmere Jehova echi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Mgbe Erọn hụrụ na ụmụ Izrel jupụtara nʼobi aṅụrị, nʼihi ihe ahụ ọ kpụrụ, o wuru ebe ịchụ aja nʼihu nwa ehi ahụ ọ kpụrụ, kwuo okwu sị, “Echi, a ga-enwe oke mmemme nye Onyenwe anyị!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 32:5
18 Iomraidhean Croise  

O we de n'akwukwọ ahu, si, Kpọsanu obu-bu-ọnu, me ka Nebot nọdu n'isi ọnọdu n'etiti ndi Israel:


Jihu we si, Donu ubọchi nb͕ochi nsọ nye Beal. Ha we kpọsa ya.


Uraija, bú onye-nchu-àjà, we wue ebe-ichu-àjà ahu: dika ihe nile si di nke eze, bú Ehaz, siri na Damaskọs zite, otú a ka Uraija, bú onye-nchu-àjà, mere, rue mb͕e eze, bú Ehaz, siri na Damaskọs bia.


Ha we guzo okwu a, ikwusa n'Israel nile, site na Bia-sheba we rue Dan, ka ha bia imere Jehova, bú Chineke Israel, ememe ngabiga nime Jerusalem: n'ihi na ha emeghi ya dika edeworo ya n'akwukwọ n'ọtutu mb͕e gara aga.


Moses we si, Ayi na umu ntà ayi na ndi-agadi-ayi gāyikọ je, ayi na umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom na ìgwè ewu na aturu-ayi na ìgwè ehi-ayi gāyikọ je; n'ihi na ememe Jehova ka ayi nwere.


Ubọchi a gāburu unu ihe-ncheta, unu gēme kwa ya ka ọ buru ememe unu nēmere Jehova: n'ọb͕ọ nile unu ka unu ganēme ya ka ọ buru ememe site n'ukpuru ebighi-ebi.


Moses we wue ebe-ichu-àjà, kpọ aha-ya Jehova-nisi:


Ọ we nara ya n'aka-ha, were ihe eji eb͕u eb͕ub͕u b͕ue ya, me ya ka ọ ghọ nwa-ehi akpuru akpu: ha we si, Ndia bu chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.


Ha we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, sure àjà-nsure-ọku, chita kwa ihe àjà-udo; ndi ahu we nọdu ala iri ihe na iṅu ihe, ha we bilie igwu egwú.


N'ihi na Efraim emewo ka ebe-ichu-àjà ba uba imehie, ya bu na ebe-ichu-àjà nile aghọworo ya nmehie.


Israel echezọwo kwa Onye ahu Nke meworo ya, o we wue ulo uku di iche iche; Juda emewo kwa ka obodo ewusiri ike ba uba: ma M'gēzite ọku n'obodo-ya nile, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.


Gwa umu Israel okwu, si ha, Mb͕e nile akara àkà nke Jehova, nke unu gākpọsa ha, ka ha buru nkpọkọta nsọ, ndia bu mb͕em akara àkà.


Unu gākpọsa kwa òkù n'otù ubọchi ahu; nkpọkọta nsọ gādiri unu: ọ dighi ozi ọ bula nke òfùfè unu gēje: ukpuru ebighi-ebi ka ọ bu n'ebe-obibi-unu nile rue ọbọ-unu nile.


Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, nke unu gākpọsa, ka ha buru nkpọkọta nsọ, iweta nso àjà-ọku anāchuru Jehova, bú àjà-nsure-ọku, na onyinye-inata-iru-ọma, àjà-ihe-ọṅuṅu, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya:


Ndia bu mb͕e akara àkà nke Jehova, bú nkpọkọta nsọ, nke unu gākpọsa na mb͕e-ha akara àkà.


ya mere, ka ayi nēme ememe ahu, ọ bughi n'ihe-iko-achicha ochie, ọ bughi kwa n'ihe-iko-achicha nke bu obi ọjọ na ajọ ọlu, kama n'achicha ekoghi-eko nke bu idi-ọcha na ezi-okwu.


Sọl we wuere Jehova ebe-ichu-àjà: nke ahu ka ọ malitere iwu ka ọ buru ebe-ichu-àjà diri Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan