Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 32:32 - Bible Nso

32 Ma ub͕u a, ọ buru na I gāb͕aghara nmehie-ha; ma ọ buru na I meghi ya, biko, hichapum n'akwukwọ-Gi nke I deworo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Ma ugbu a, biko, gbaghara mmehie ha. Ọ bụrụ na ị gaghị agbaghara ha, biko hichapụ aha m site nʼakwụkwọ ahụ i dere.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 32:32
26 Iomraidhean Croise  

Eze we ma jijiji nke-uku, rigo rue ulo-elu nke ọnu-uzọ-ama, kwa ákwá: ma otú a ka o siri mb͕e ọ nēje, Nwam Absalom, nwam, nwam Absalom! ọ gādim nọ̄ nma ma asi na mu onwem anwuwo n'ọnọdu gi, Absalom, nwam, nwam!


Anya-Gi abua huru arum mb͕e o kēzughi okè, Ọ bu kwa n'akwukwọ-Gi ka edere ihe nile dim n'aru, Nke akpuru kwa-ubọchi, Mb͕e ọ dighi otù ihe di nime ha.


Nwagharim ka Gi onwe-gi guworo ọnu: Tiye anya-mirim nile nime karama-akpukpọ-Gi; Hà adighi n'akwukwọ-Gi:


Me ka ehichapu ha n'akwukwọ ndi di ndu, Ekwe-kwa-la ka edekọ ha na ndi ezi omume n'akwukwọ.


ma ub͕u a kwe ka M'nọduru Onwem, ka iwem we di ọku megide ha, ka M'we me kwa ka ha gwusia; M'gēme kwa gi ka i buru mba uku.


O gēru kwa, na onye emeworo ka ọ fọdu na Zaion, na onye fọduru na Jeruzalem, onye nsọ ka agākpọ ya, bú onye ọ bula nke edeworo ya n'akwukwọ idi ndu nime Jerusalem:


Akam gādi kwa imegide ndi-amuma ahu ndi nāhu ọhù efu, ndi nāju kwa ase ugha: ha agaghi-adi n'ìzù nzuzo nke ndim, agaghi-ede kwa ha n'odide-akwukwọ ulo Israel, ha agaghi-abà kwa n'ala Israel; unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.


Ma na mb͕e ahu ka Maikael gēguzo ọtọ, bú onye-isi uku ahu nke nēguzo n'akuku umu ndi-gi: mb͕e ahuhu gādi kwa, nke mb͕e di otú ahu nādighi site na mb͕e mba ọ bula malitere idi rue mb͕e ahu: ma na mb͕e ahu ka agēme ka ndi-gi wepuga onwe-ha, bú onye ọ bula agāhu na edeworo aha-ya n'akwukwọ.


O rue, mb͕e ha ripiasiri ihe-ọkukú nile nke ala, na m'siri, Onye-nwe-ayi Jehova, biko, b͕aghara: Jekob, ò gēsi aṅa guzosie ike? n'ihi na onye ntà ka ọ bu.


Mḅe ahu ndi nātu egwu Jehova nēkwurita okwu, otú onye na ibe-ya: Jehova we ṅa nti, nu, ewe dere ndi nātu egwu Jehova, ndi nēchè kwa èchìchè aha-Ya, akwukwọ ncheta n'iru Ya.


Ha gābu kwa nkem, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, n'ubọchi ahu mḅe Mu onwem ganēme ihe, bú ihe nke akam; M'gēnwe kwa ọmiko n'aru ha, dika madu si enwe ọmiko n'aru nwa-ya nke nēfè ya.


Ma ọ buru na otú a ka Gi onwe-gi nēmem, biko, gbuziem, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi; ka m'ghara kwa ilekwasi ihe ọjọm anya.


Jehova we ridata n'igwe-oji ahu, gwa ya okwu, nara ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasiri ya, tiyekwasi n'ọgu ndi-okenye atọ na iri ahu: o rue, mb͕e Mọ ahu bekwasiri ha, na ha buru amuma, ma ha emeghi ya ọzọ.


Biko, b͕aghara ajọ omume nke ndi nka dika idi-uku nke ebere-Gi si di, na dika I b͕agharaworo ndi nka, site n'Ijipt we rue ub͕u a.


Otú ọ di, unu aṅurila ọṅu na nka, na anēdo ndi ajọ mọ n'okpuru unu; ma ṅurianu ọṅu na edewo aha-unu n'akwukwọ n'elu-igwe.


Ma Jisus siri, Nna, b͕aghara ha; n'ihi na ha amataghi ihi ha nēme. Mb͕e ha nēkè kwa uwe-Ya n'etiti onwe-ha ha fere nzà.


N'ihi na anamekperi ekpere, ka mu onwem buru anathema pua n'ebe Kraist nọ n'ihi umu-nnem, ndi-ikwum dika anu-aru si di:


O gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēmewori ka i pua n'aka ndi-iro-gi buruburu, zuru ike, n'ala nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi n'ihe-nketa, ka i we nweta ya, na i gēhichapu ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe; echezọla.


Jehova agaghi-ekwe ib͕aghara ya, kama mb͕e ahu iwe Jehova na ekworo-Ya gākwu anwuru-ọku imegide nwoke ahu, ọb͕ub͕a-iyi nile edeworo n'akwukwọ a gāmakpu kwa n'aru ya, Jehova gēhichapu kwa aha-ya n'okpuru elu-igwe.


ram aka, ka M'we kpochapu ha, hichapu kwa aha-ha n'okpuru elu-igwe: M'gēme kwa gi ka i buru mba di ike ba kwa uba kari ha.


E, ariọkwam gi, onye ekekọtaworo mu na gi n'ezie n'ọlu Chineke, yere ndinyom ahu aka, n'ihi na mu na ha b͕akọsiri nb͕a ike n'ozi oma, gi na Klement, na ndi fọduru mu na ha nālukọ ọlu, ndi aha-ha di n'akwukwọ nke ndu.


Anu-ọhia ahu nke i huru diri, ọ dighi kwa ub͕u a; ọ gaje kwa isi n'abyss ahu rigoputa, na ila n'iyì. Ọ gēju kwa ndi bi n'elu uwa anya, bú ndi anēdeghi aha-ha n'akwukwọ nke ndu ahu site n'oge itọ ntọ-ala uwa, mb͕e ha nēle anu-ọhia ahu anya, na ọ diri, ọ dighi kwa ub͕u a, ọ gābia kwa.


ọ dighi kwa ihe ọ bula emeruru emeru, ma-ọbu onye nēme ihe-árú na ugha, gābà nime ya ma-ọli: kama ọ bu nání ndi edeworo aha-ha n'akwukwọ nke ndu Nwa-aturu ahu.


ọ buru kwa na onye ọ bula gēwepu okwu nime okwu nile nke akwukwọ nke amuma nka, Chineke gēwepu òkè-ya n'osisi nke ndu ahu, wepu kwa òkè-ya n'obodo nsọ ahu, bú ihe edeworo n'akwukwọ a.


Onye nēmeri emeri ka agēb͕okwasi uwe ọcha otú a; M'gaghi-ehichapu kwa aha-ya nime akwukwọ nke ndu nkem ma-ọli, M'gēkwuputa kwa aha-ya n'iru Nnam, na n'iru ndi-mọ-ozi-Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan