Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 32:15 - Bible Nso

15 Moses we chigharia, si n'ugwu ahu rida, mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu di kwa n'aka-ya; bú mbadamba nkume nke edere ihe n'iru ha abua; n'otù iru na n'iru nke-ọzọ ka edeworo ihe n'elu nkume ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Mgbe ahụ, Mosis tụgharịrị site nʼugwu ahụ rịdata, mbadamba nkume abụọ nke iwu ọgbụgba ndụ ahụ dị ya nʼaka. E dere ha ihe nʼihu abụọ, nʼihu nakwa nʼazụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 32:15
14 Iomraidhean Croise  

Iwu Jehova zuru okè, nēweghachi nkpuru-obi: Ihe-àmà Jehova kwesiri ntukwasi-obi, nēme ka onye nēnweghi uche mara ihe.


Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka Eron dọbara ya n'iru Ihe-àmà, ka ọ buru ihe-ndebe.


Jehova we si Moses, Rigokutem rue ugwu a, nọ kwa n'ebe ahu: ka M'nye kwa gi nkume abua ahu di mbadamba, na iwum, na ihe M'nyere n'iwu, bú nke M'deworo, ka i we zí ha.


Moses we ba n'etiti igwe-oji ahu, rigorue ugwu ahu: Moses we nọ n'ugwu ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali.


Mb͕e Ọ kpayesiri Moses uka n'ugwu Sainai, O we nye ya mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu, bú mbadamba nkume, nke ewere nkpisi-aka Chineke de ihe n'elu ha.


Mbadamba nkume ahu, ọlu Chineke ka ha bu; odide ahu kwa, odide Chineke ka ọ bu, bú eb͕ub͕u eb͕uru n'elu mbadamba nkume abua ahu.


O rue, mb͕e Moses siri n'ugwu Sainai rida (mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu di kwa n'aka Moses mb͕e o siri n'ugwu ahu rida), na Moses amaghi na akpukpọ iru-ya nēnwuputa ìhè mb͕e Ọ kpayere ya uka.


O were ihe-àmà ahu tiye n'ib͕e ahu, tukwasi nkpa-n'aka-ya abua n'ib͕e ahu, tiyekwasi ebe-nkpuchi-nmehie n'ib͕e ahu n'elu:


ebe emere ka unu puta ìhè na unu bu akwukwọ-ozi Kraist, nke ayi jere ozi ya, nke anējighi ink de, kama ọ bu Mọ nke Chineke di ndu ka eji de ya; ọ bughi n'elu mbadamba nkume, kama ọ bu n'elu mbadamba ihe di iche, bú obi nke anu-aru.


Ma ọ buru na ije-ozi nke ọnwu, nke edeworo n'akwukwọ, nke atuworo n'elu nkume, biara n'ebube, nke mere umu Israel apughi ilegide iru Moses anya n'ihi ebube nke iru-ya; ebube nke anēme ka ọ ghara idi irè:


Okwu ndia ka Jehova were oké olu gwa nkpọkọta-unu nile n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu, na igwe-oji ahu, na oké ọchichiri ahu: ma Ọ tukwasighi ihe ọzọ. O we dekwasi ha na mbadamba nkume abua, were ha nyem.


M'we chigharia, si n'ugwu ahu rida, ugwu ahu nēre kwa ọku: mbadamba nkume abua nke ọb͕ub͕a-ndu ahu di kwa n'elu akam abua.


nke nwere ebe-ichu-àjà ọla-edo isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na ib͕e nke ọb͕ub͕a-ndu ahu nke amachitara ọla-edo gburugburu n'akuku nile, nke ite ọla-edo nke nwere manna di nime ya, ya na nkpa-n'aka ahu nke Eron nke mara ifuru, na mbadamba nkume abua nke ọb͕ub͕a-ndu ahu;


M'we hu akwukwọ nke edere ya-ri ihe n'ime na azu, nke eji-kwa-rari akàrà asa kasie ya ike, ka ọ di n'aka-nri Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan