Nwa nke nwayi di-ya nwuru ka ọ bu, sitere n'ebo Naftali, ma nna-ya bu nwoke Taia, bú ọkpu-ọla; o juputara n'amam-ihe na nghọta na ihe-ọmuma, ije ozi ọ bula n'ọla. O we biakute eze, bú Solomon, je ozi-ya nile.
Moses we si Jehova, Le, Gi onwe-gi nāsim, Me ka ndi nka rigota: ma Gi onwe-gi emeghi ka M'mara onye I gēziga ka mu na ya yikọ je. Ma Gi onwe-gi asiwo, Amawom i n'aha, ọzọ kwa, i hutawo amara n'irum.
Bezalel na Ọhọliab gālu kwa ọlu, ha na nwoke ọ bula nke nwere obi amam-ihe, ndi Jehova tiyeworo amam-ihe na nghọta nime ha ka ha mara ije ozi ọ bula nke òfùfè nke ebe nsọ ahu, dika ihe nile si di nke Jehova nyere n'iwu.
Bezalel me-kwa-ra ib͕e osisi acacia: cubit abua na nkera ka ogologo-ya di, otù cubit na nkera ka obosara-ya di kwa, otù cubit na nkera ka elu-ya di kwa:
Ma onye soro ya n'ọlu ahu bu Ọhọliab, nwa Ahisamak, nke ebo Dan, bú onye nātu akika, na onye-ọ̀kà, na onye-ọdudu-ákwà n'ogho anunu, na n'ogho ododo, na n'ogho uhie, na n'ezi ákwà ọcha.