Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 31:2 - Bible Nso

2 Le, akpọwom Bezalel n'aha, bú nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Lee, ahọpụtala m Bezalel nwa Uri, nwa Hua, onye si nʼebo Juda,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 31:2
14 Iomraidhean Croise  

Nwa nke nwayi di-ya nwuru ka ọ bu, sitere n'ebo Naftali, ma nna-ya bu nwoke Taia, bú ọkpu-ọla; o juputara n'amam-ihe na nghọta na ihe-ọmuma, ije ozi ọ bula n'ọla. O we biakute eze, bú Solomon, je ozi-ya nile.


Ma ebe-ichu-àjà ọla ahu, nke Bezalel nwa Uri, nwa Hua, mere, di n'ebe ahu n'iru ebe-obibi Jehova: Solomon na nkpọkọta ahu we chọ ya.


Joshua we me dika Moses siri ya, ibuso Amalek agha: ma Moses na Eron na Hua rigoro n'elu ugwu ntà ahu.


Moses we si Jehova, Le, Gi onwe-gi nāsim, Me ka ndi nka rigota: ma Gi onwe-gi emeghi ka M'mara onye I gēziga ka mu na ya yikọ je. Ma Gi onwe-gi asiwo, Amawom i n'aha, ọzọ kwa, i hutawo amara n'irum.


Jehova we si Moses, Ihe a nke i kwuworo, M'gēme kwa ya: n'ihi na i hutawo amara n'irum, amawokwam i n'aha.


Moses we si umu Israel, Lenu, Jehova akpọwo Bezalel n'aka, bú nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda;


Bezalel na Ọhọliab gālu kwa ọlu, ha na nwoke ọ bula nke nwere obi amam-ihe, ndi Jehova tiyeworo amam-ihe na nghọta nime ha ka ha mara ije ozi ọ bula nke òfùfè nke ebe nsọ ahu, dika ihe nile si di nke Jehova nyere n'iwu.


Bezalel me-kwa-ra ib͕e osisi acacia: cubit abua na nkera ka ogologo-ya di, otù cubit na nkera ka obosara-ya di kwa, otù cubit na nkera ka elu-ya di kwa:


Ma Bezalel nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda, mere ihe nile Jehova nyere Moses n'iwu.


Ma onye soro ya n'ọlu ahu bu Ọhọliab, nwa Ahisamak, nke ebo Dan, bú onye nātu akika, na onye-ọ̀kà, na onye-ọdudu-ákwà n'ogho anunu, na n'ogho ododo, na n'ogho uhie, na n'ezi ákwà ọcha.


Jọn zara, si, Madu apughi inata ihe ọ bula, ọ buru na eweghi ya nye ya site n'elu-igwe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan