O me-kwa-ra oké osimiri awuru awu, cubit iri site n'otù ọnu-ya rue ọnu-ya nke-ọzọ, ọ di gburugburu gburugburu, cubit ise ka idi-elu-ya di: eriri nke orú cubit na iri b͕a-kwa-ra ya buruburu.
O me kwa ite ọsisa-miri iri nke ọla: ọgu bath abua ka otù ite ọsisa-miri nānagide: cubit anọ ka ite ọsisa-miri ọ bula di: otù ite ọsisa-miri di n'elu ihe-ndọkwasi ọ bula n'ihe-ndọkwasi iri ahu.
O me-kwa-ra ite ọsisa-miri iri, tiye ise n'aka-nri, na ise n'aka-ekpe, iji sa anu; ihe diri àjà-nsure-ọku ka ha nāṅacha nime ha: ma oké osimiri ahu diri ndi-nchu-àjà iji sa aru.
I gānara kwa ego nkpuchi-nmehie ahu n'aka umu Israel, nye ya n'òfùfè nke ulo-ikwū nzute; ka ọ we buru umu Israel ihe-ncheta n'iru Jehova, ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie.
O me-kwa-ra ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku ahu, ọ bu osisi acacia: cubit ise ka ogologo-ya di, cubit ise ka obosara-ya di kwa, o nwere akuku anọ ra nrata; cubit atọ ka idi-elu-ya di kwa.
O me-kwa-ra ite ọsisa-miri, ọ bu ọla, ukwu-ala-ya bu kwa ọla: ọ bu enyo nke ndinyom nēzukọ n'usu n'usu, ndi nēzukọ n'usu n'ọnu-uzọ ulo-ikwū nzute, ka o ji me ya.