Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 3:22 - Bible Nso

22 ma nwayi ọ bula gāriọta n'aka nwayi-ab͕ata-obi-ya, na n'aka nwayi nọ n'ulo-ya dika ọbìa, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe-nb͕okwasi: unu gētiye kwa ha n'aru umu-unu ndikom na n'aru umu-unu ndinyom; unu gānapu kwa ndi Ijipt ihe-ha n'aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Nwanyị ọbụla ga-arịọ site nʼaka nwanyị Ijipt onye agbataobi ya na nwanyị ọbịa bi nʼụlọ ya, ihe niile e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ, na akwa dị iche iche. Unu ga-eyikwasị ha ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom, bịa si otu a kwakọrọ ngwongwo ndị Ijipt.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 3:22
9 Iomraidhean Croise  

ọzọ kwa, mba ahu nke ha gēfè ka M'ganēkpe ikpe: emesia ha gāchiri àkù uku puta.


Orù ahu we chiputa ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe, nye Rebeka: ihe di iche iche nke di oké ọnu-ahia ka ọ nyekwara nwa-nne-ya nwoke na nne-ya.


O we me ka ha puta chiri ọla-ọcha na ọla-edo: Ọ dighi kwa onye nāsu ngọngọ n'etiti ebo-Ya nile.


Biko, kwue na nti ndim, ka ha riọ kwa, nwoke ọ bula n'aka nwoke-ibe-ya na nwayi ọ bula n'aka nwayi-ibe-ya, ihe ọla-ọcha na ihe ọla-edo.


Ezi madu nēme ka umu umu-ya keta ihe-ya; Ma ihe anākpakọbara onye ezi omume ka àkù onye-nmehie bu.


Ahuhu gādiri gi onye nāpunara madu ihe, ma gi onwe-gi bu onye anāpunaraghi ihe; onye nāghọb͕u kwa aghọb͕u, ma ha aghọb͕ughi gi! mb͕e i napubìri madu ihe, agāpunara gi ihe; mb͕e i ghọb͕ubìri, ha gāghọb͕u gi.


ha ewe ghara ikpata nkú n'ọhia, ha agaghi-eb͕utu kwa nkú n'oké ọhia; n'ihi na ha gāchiri ihe-agha funwue ọku: ha gākwata kwa ndi-nkwata-ha, luta kwa ndi-nluta-ha n'agha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan