Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 3:10 - Bible Nso

10 Ub͕u a kwa, bia, M'gēzì kwa gi jekuru Fero; gi me kwa ka ndim, bú umu Israel, si n'Ijipt puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ugbu a, aga m eziga gị ka i jekwuru Fero, ka i dupụta ndị m bụ ụmụ Izrel site nʼala Ijipt.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 3:10
20 Iomraidhean Croise  

Ọ si Abram, Mara nke-ọma na nkpuru-gi gābu ọbìa n'ala nābughi nke ha, ha gēfè kwa ha; ha gēweda ha ala nnù arọ;


ọzọ kwa, mba ahu nke ha gēfè ka M'ganēkpe ikpe: emesia ha gāchiri àkù uku puta.


O zigara Moses, bú orù-Ya, Na Eron onye Ọ rọputara.


I duru ndi-Gi dika ìgwè ewu na aturu, Site n'aka Moses na Eron.


Ma obibi umu Israel, nke ha biri n'Ijipt, di nnù arọ na orú arọ na iri.


O rue, n'ọgwugwu nnù arọ na orú arọ na iri ahu, ọ bu kwa n'otù ubọchi ahu ka o ruru, na usu nile nke ndi-agha Jehova siri n'ala Ijipt pua.


Moses we si Jehova, Le, Gi onwe-gi nāsim, Me ka ndi nka rigota: ma Gi onwe-gi emeghi ka M'mara onye I gēziga ka mu na ya yikọ je. Ma Gi onwe-gi asiwo, Amawom i n'aha, ọzọ kwa, i hutawo amara n'irum.


Ma ub͕u a, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, biko, mem ka m'mara uzọ-Gi nile, m'gāmara kwa Gi, ka m'we huta amara n'iru Gi: Gi le kwa na ndi-Gi ka mba nka bu.


Ndia bu Eron na Moses ahu, ndi Jehova siri, Menu ka umu Israel si n'ala Ijipt puta n'usu nile nke ndi-agha-ha.


Ọ bu kwa onye-amuma ka Jehova jiri me ka Israel si n'Ijipt rigoputa, ọ bu kwa onye-amuma ka ejiri debe ya.


N'ihi na M'mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa, ọ bu kwa n'ulo ndi-orù ka M'b͕aputara gi; M'we ziga Moses na Eron na Miriam iga n'iru gi.


N'ezie ahuwom ihe ọjọ anēme ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam isu-udè-ha, M'we ridata iweputa ha: ub͕u a bia kwa, M'gēziga gi n'Ijipt.


Nwoke a duputara ha, mb͕e ọ lusiri ọlu-ebube di iche iche na ihe-iriba-ama di iche iche n'Ijipt, na nime Oké Osimiri Uhie, na nime ọhia ọgu arọ abua.


Ma Chineke kwuru okwu otú a, na nkpuru-ya gānọ dika ndi-ọbìa n'ala nābughi nke aka ha, na ndi ala ahu gēme kwa ha ka ha buru ndi-orù, me kwa ha ihe ọjọ, nnù arọ.


Mba ahu nke ha gābu orù-ha ka Mu onwem gēkpe kwa ikpé, ka Chineke kwuru: mb͕e ihe ndia gasiri ha gāputa kwa, kpe-kwa-ram n'ebe a.


Jehova we che ya iru, si, Je n'ike-gi a, zọputa Israel n'aka Midian: èzigaghm i?


Samuel we si ndi Israel, Ọ bu Jehova Nke mere Moses na Eron ndi-ndú, Nke me-kwa-ra nna-unu-hà ka ha si n'ala Ijipt rigota.


Mb͕e Jekob batara n'Ijipt, mb͕e nna-unu-hà tikuru Jehova nkpu, Jehova we zite Moses na Eron, ndi mere ka nna-unu-hà si n'Ijipt puta, me kwa ka ha biri n'ebe a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan