Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 29:2 - Bible Nso

2 na achicha ekoghieko, na ob͕e achicha ufọdu ekoghieko nke agwara manu, na mbadamba-achicha ufọdu ekoghi-eko nke etere manu: utu flour nke ọka wheat ka i gēwere me ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Werekwa ọka wiiti a kwọrọ nke ọma, mee achịcha nke na-enweghị ihe na-eko achịcha e tinyere nʼime ha, achịcha mbadamba na-ekoghị eko nke e ji mmanụ oliv gwakọtaa, ya na achịcha mbadamba ọzọ dị nta na-ekoghị eko nke e tere mmanụ nʼahụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 29:2
14 Iomraidhean Croise  

Ha gēri anu-aru-ya n'abali ahu, aruru n'ọku, ya na achicha ekoghi-eko; tiyere ihe di iche iche nēlu ilu ka ha gēri ya.


na otù ob͕e achicha, na otù ob͕e achicha agwara manu, na otù mbadamba-achicha, site na nkata achicha ekoghi-eko ahu nke di n'iru Jehova:


I gētiye ha n'otù nkata, bute ha nso nime nkata ahu, ha na oke-ehi ahu na ebulu abua ahu.


I gētiye manu n'elu ya, tukwasi ya frankincense: onyinye-inata-iru-ọma ka ọ bu.


Mb͕e dum ka agēme ka ọku nēre ere n'elu ebe-ichu-àjà; ọ gaghi-anyu anyu.


Ọzọ onyinye-inata-iru-ọma ọ bula, agwara manu, ma-ọbu nke kpọrọ akpọ, umu-ndikom Eron nile gēnwe ya, otù dika ibe-ya.


Ọ buru na ọ weta ya nso ka ọ buru àjà-ekele, ọ gēweta kwa nso ob͕e achicha ekoghi-eko ufọdu nke agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na ob͕e achicha ufọdu agwara manu, nke utu ọka flour dere edè, tiyere àjà-ekele ahu.


Chiri Eron na umu-ya ndikom tiyere ya, na uwe-ha, na manu otite-manu ahu, na oke-ehi nke àjà-nmehie, na ebulu abua ahu, na nkata achicha ekoghi-eko;


o si na nkata achicha ekoghi-eko ahu nke di n'iru Jehova were otù ob͕e achicha ekoghi-eko, na otù ob͕e achicha agwara manu, na otù mbadamba-achicha, tukwasi ha n'abuba ahu na n'utaku-ukwu aka-nri:


na nkata achicha ekoghi-eko, ob͕e achicha nke utu ọka flour agwara manu, na mbadamba-achicha ekoghi-eko ufọdu nke etere manu, na onyinye-inata-iruọma-ha, na àjà-ihe-ọṅuṅu nile ha.


Onye-nchu-aja gēwere ọkwa-aka esiri esi nke ebulu ahu, na otù ob͕e achicha ekoghi-eko sitere na nkata ahu, na otù mbadamba-achicha ekoghi-eko, tiye ha n'elu ọbu-aka abua nke onye-Nazirait ahu, mb͕e ọ kọpusiri isi nke nkewaputa-ya:


Sachapunu ihe-iko-achicha ochie, ka unu we buru ob͕e utu ọka agwọrọ agwọ ọhu, dika unu bu achicha ekoghi-eko. N'ihi na achu-kwa-ra àjà-ngabiga-ayi, bú Kraist:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan