Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 29:10 - Bible Nso

10 I gākputa kwa oke-ehi ahu nso n'iru ulo-ikwū nzute: Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi aka-ha n'isi oke-ehi ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 “Kpụta oke ehi ahụ nʼihu ụlọ nzute. Erọn na ụmụ ndị ikom ga-ebikwasị aka ha nʼelu isi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 29:10
13 Iomraidhean Croise  

I gēb͕u kwa oke-ehi ahu n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.


Otù nime ebulu abua ahu ka i gēwere kwa; Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu.


I gēwere kwa ebulu nke-ọzọ; Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi kwa aka-ha n'isi ebulu ahu.


Ayi nile kpafuru akpafu dika ìgwè aturu: ayi chere iru, onye ọ bula n'uzọ nke aka ya: ma Jehova emewo ka ajọ omume nke ayi nile dakwasi ya.


Mb͕e i wepusiri nmehie-ya, i gēweta nso nwa-oke-ehi nke zuru okè, na ebulu nke zuru okè site n'ìgwè ewu na aturu-gi.


O gēbikwasi aka-ya n'isi àjà-nsure-ọku ahu; agānara kwa ya nke-ọma n'ọnọdu ya iji kpuchiri ya nmehie-ya.


Eron gēbikwasi kwa aka-ya abua n'isi nkpi ahu di ndu, kwuputa n'elu ya ajọ omume nile nke umu Israel, na njehie-ha nile, bú nmehie-ha nile; o gētiye kwa ha n'elu isi nkpi ahu, zilaga ya n'ọzara site n'aka nwoke jikere ejikere:


O gēbikwasi aka-ya n'isi onyinye-ya iji biaru nso, b͕u kwa ya n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute: umu-ndikom Eron, bú ndi-nchu-àjà, gāwusa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà buruburu.


Ọ gēme ka oke-ehi ahu biarute ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute n'iru Jehova; ọ gēbikwasi aka-ya n'isi oke-ehi ahu, b͕u kwa oké-ehi ahu n'iru Jehova.


Ọ kputa oke-ehi nke àjà-nmehie nso: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'oke-ehi nke àjà-nmehie.


Ọ weta nso ebulu nke àjà-nsure-ọku: Eron na umu-ya ndikom we bikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu.


Ndi Livai gēbikwasi aka-ha n'isi oke-ehi abua ahu: gi me otù nime ha ka ọ buru àjà-nmehie, me ibe-ya ka ọ buru àjà-nsure-ọku, ichuru Jehova, ikpuchiri ndi Livai nmehie-ha.


Onye ahu Nke nāmaghi nmehie ka O mere ka Ọ buru nmehie n'ọnọdu ayi; ka ayi onwe-ayi we ghọ ezi omume Chineke nime Ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan