Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 28:6 - Bible Nso

6 Ha gēme kwa ephod ahu; ọ gābu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, bú ọlu onye-ọ̀kà.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 “Weere ogho ọlaedo, na nke na-acha anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee efọọd ahụ, nke bụ akaọrụ onye ǹka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 28:6
11 Iomraidhean Croise  

na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu;


na nkume onyx, na nkume di iche iche ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi.


Ebe-obibim ka i gēme kwa: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu onye-ọ̀kà, ihe ndia ka i gēji me ha.


Ọ gēnwe kwa ubu abua ejikọtara na nsọtu-ya abua; ka ewe jikọta ya n'otù.


I gāchiri kwa uwe ahu, yikwasi Eron uwe-ime, na uwe-nwuda ephod, na ephod, na ihe-ib͕ochi-obi, were kwa ihe-ọkiké nke ephod nke onye-ọ̀kà kpara ke ya:


N'ihi na ọtutu ubọchi ka umu Israel gānọdu nēnweghi eze, nēnweghi kwa onye-isi, nēnweghi kwa àjà, nēnweghi kwa ogidi, nēnweghi kwa ephod na teraphim:


O tiye n'aru ya uwe-ime ahu, were ihe ike n'úkwù ke ya, yikwasi ya uwe-nwuda, tiye ephod n'aru ya, ke ya n'ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara, were ya kegide ephod ahu n'aru ya.


Gideon we me ya ka ọ buru ephod, guzo ya ọtọ n'obodọ-ya, bú Ọfra: Israel nile we soro ya nākwa iko n'ebe ahu: o we ghọrọ Gideon, ghọ-kwa-ra ulo-ya, ọnyà.


O rue, mb͕e Abaiata nwa Ahimelek b͕akuru Devid rue Keila, na ọ chiri ephod n'aka-ya rida.


Devid we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, bú nwa Ahimelek, Biko, chitaram ephod nso. Abaiata we chita ephod ahu nso n'ebe Devid nọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan