Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 28:3 - Bible Nso

3 Gi onwe-gi gāgwa kwa ndi nile nwere obi amam-ihe, bú ndi M'mejuworo na mọ amam-ihe, ka ha me uwe Eron ido ya nsọ, ka o we burum onye-nchu-aja.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Gwa ndị niile nwere onyinye ǹka nʼịdụ akwa, bụ ndị m nyere amamihe nʼihe ndị a, sị ha dụọrọ Erọn uwe pụrụ iche, nke e ji edo ya nsọ, ime ya onye na-ejere m ozi dịka onye nchụaja.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 28:3
16 Iomraidhean Croise  

Nwa nke nwayi di-ya nwuru ka ọ bu, sitere n'ebo Naftali, ma nna-ya bu nwoke Taia, bú ọkpu-ọla; o juputara n'amam-ihe na nghọta na ihe-ọmuma, ije ozi ọ bula n'ọla. O we biakute eze, bú Solomon, je ozi-ya nile.


Onye ọ bula n'etiti unu nke nwere obi amam-ihe, ha gābia kwa, me ihe nile nke Jehova nyere n'iwu;


Nwayi ọ bula nke nwere obi amam-ihe were kwa aka-ya tu ogho, ha we weta ogho nke ha turu, bú ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, na ezi ákwà ọcha ahu.


Moses we si umu Israel, Lenu, Jehova akpọwo Bezalel n'aka, bú nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda;


Ọ mejuwo kwa ya na Mọ nke Chineke, n'amam-ihe, na nime nghọta, na n'ihe-ọmuma, na n'ije-ozi ọ bula;


O me-juwo ha n'amam-ihe nke obi, ije ozi ọ bula, nke onye nātu akika, na nke onye-ọ̀kà, na nke onye-ọdudu-ákwà, bú n'ogho anunu, na n'ogho ododo, na n'ogho uhie, na n'ezi ákwà ọcha, na nke ọkpa-ákwà, bú ije ozi nke ndi nēje ozi ọ bula, na nke ndi nēcheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche.


Bezalel na Ọhọliab gālu kwa ọlu, ha na nwoke ọ bula nke nwere obi amam-ihe, ndi Jehova tiyeworo amam-ihe na nghọta nime ha ka ha mara ije ozi ọ bula nke òfùfè nke ebe nsọ ahu, dika ihe nile si di nke Jehova nyere n'iwu.


Moses we kpọ Bezalel na Ọhọliab, na nwoke ọ bula nwere obi amam-ihe, onye Jehova tiyere amam-ihe n'obi-ya, onye ọ bula nke obi-ya kwaliri ya ibiaru nso ozi ahu ije ya:


N'ihi na Jehova nēnye amam-ihe; N'ọnu-Ya ka ihe-ọmuma na nghọta si aputa:


Mọ nke Jehova gēnwe kwa ọnọdu-Ya n'aru ya, bú Mọ nke amam-ihe na nghọta, Mọ nke ndum-ọdu na idi-ike, Mọ nke ihe-ọmuma na egwu Jehova;


ka Chineke nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, bú Nna nke ebube, we nye unu Mọ nke amam-ihe na nkpughe nime nmazu-Ya;


Joshua nwa Nun we juputa na mọ nke amam-ihe; n'ihi na Moses ebikwasiwo ya aka-ya abua: umu Israel we ge ya nti, me kwa dika Jehova nyere Moses iwu.


Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru okè nke enyere enye si n'elu bia, ebe o si n'aka Nna nke ìhè ridata, Onye ọghugha ọ bula nāpughi idi n'ebe Ọ nọ, ma-ọbu onyinyo nke nchighari nēweta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan