Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 28:15 - Bible Nso

15 I gēme kwa ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé, ọ gābu ọlu nke onye-ọ̀kà; dika ọlu aluru n'ephod ahu ka i gēme ya; ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ndia ka i gēji me ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 “Ị ga-adụ ihe mgbochi obi nke ikpe, nke bụ ọrụ aka onye ǹka. Mee ya dịka efọọd ahụ: jiri ogho edo edo, nke anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie, na nke uhie uhie nakwa ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 28:15
11 Iomraidhean Croise  

na nkume onyx, na nkume di iche iche ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi.


Ebe-obibim ka i gēme kwa: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu onye-ọ̀kà, ihe ndia ka i gēji me ha.


I gēme-kwa-ra ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu ákwá-nkwuchi, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma; ọ gābu ọlu onye-ọdudu-ákwà.


na iyab͕a abua nke ọla-edo anāgwaghi agwa; dika eriri-nma ka i gēme ha, ihe emere dika udọ̀ aturu atu; i gētiye kwa iyab͕a ahu aturu atu dika udọ̀ n'elu ihe ọla-edo ahu akpara akpà.


Ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ gābu, ihe apiajiri apiaji, ntù-aka ka ogologo-ya gādi, ntù-aka ka obosara-ya gādi kwa.


I gētiye kwa n'ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé ahu Ìhè ahu na Izu-okè ahu; ha gādi kwa n'elu obi Eron mb͕e ọ nābà nime n'iru Jehova: Eron gēbu kwa ikpé nke umu Israel n'elu obi-ya n'iru Jehova mb͕e dum.


Ndia bu uwe ha gēme; ihe-ib͕ochi-obi, na ephod, na uwe-nwuda, na uwe-ime turu agwa, na nkechi isi, na ihe ike n'úkwù: ha gēme-kwa-ra Eron, bú nwa-nne-gi, na umu-ya ndikom, uwe nsọ, ka ọ we burum onye-nchu-àjà.


Ha gēme kwa ephod ahu; ọ gābu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, bú ọlu onye-ọ̀kà.


I gāchiri kwa uwe ahu, yikwasi Eron uwe-ime, na uwe-nwuda ephod, na ephod, na ihe-ib͕ochi-obi, were kwa ihe-ọkiké nke ephod nke onye-ọ̀kà kpara ke ya:


Ọ tukwasi n'aru ya ihe-ib͕ochi-obi; tiye kwa n'elu ihe-ib͕ochi-obi Ìhè ahu na Izu-okè ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan