Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 27:19 - Bible Nso

19 Ihe nile nke ebe-obibi ahu n'òfùfè-ya nile, na ǹtú-ya nile, na ǹtú nile nke ogige ahu, gābu ọla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Ngwongwo niile nke e ji eje ozi nʼụlọ nzute ahụ, ihe ọbụla bụ ọrụ ha, tinyere ǹtu ya niile na nke ogige ahụ, ga-abụ ihe e ji bronz rụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 27:19
14 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a na mb͕e dika nwa ntabi-anya amara esitewo n'aka Jehova, bú Chineke-ayi, ime ka ndi b͕apuru ab͕apu fọduru ayi, na inye ayi otù ǹtú n'ebe nsọ Ya, ka Chineke-ayi we nye anya-ayi ìhè, na idebere ayi nwantī ndu n'ọbubu-orù-ayi.


Ogologo nke ogige ahu gābu ọgu cubit ise, obosara-ya gābu ọgu abua na iri ọgu abua na iri, idi-elu-ya gābu cubit ise; ọ gābu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ma ukwu-ha gābu ọla.


Ma gi onwe-gi, i gēnye umu Israel iwu, ka ha wetara gi manu olive anāgwaghi agwa nke asuru asu, itiye n'ihe nēnye ìhè, iweli oriọna mb͕e dum.


I gēme kwa ite-ya nile inara ntu-ya, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya nile, na ndudu-ya nile, na ihe-igu-ọku-ya nile: ọbuná ihe-ya nile ka i geji ọla me.


na ǹtú nile nke ebe-obibi ahu; na ǹtú nile nke ogige, na udọ̀ nile ha;


Ma ǹtú nile ebe-obibi ahu nwere, na nke ogige ahu buruburu nwere, bu ọla.


na ukwu nile nke ide ogige ahu buruburu, na ukwu nile nke ide ọnu-uzọ-ama ogige ahu, na ǹtú nile nke ebe-obibi ahu, na ǹtú nile nke ogige ahu buruburu.


na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ide-ya nile, na ukwu ide-ya, na ákwà-nkwuchi ọnu-uzọ-ama ogige ahu nwere, na udọ̀-ya nile, na ǹtú-ya nile, na ihe nile nke òfùfè ebe-obibi ahu, nke diri ulo-ikwū nzute ahu;


Okwu nile nke ndi mara ihe di ka ndudu eji achu ehi, ọzọ, dika ǹtú akumiri nke-ọma ka okwu nke ndi-nwe nzukọ di, bú okwu enyere site n'aka otù onye-ọzùzù-aturu.


Lekwasi Zaion anya, bú obodo nke mb͕e nile ayi akara àkà: anya-gi abua gāhu Jerusalem na ọ bu ulo-obibi di jū, ulo-ikwū nke anāgaghi-ebupu ebupu, nke anāgaghi-eropu ǹtú-ya ọ bula rue ebighi-ebi, nke anāgaghi-adọbi kwa udọ̀-ya ọ bula.


N'aka-Ya ka nkume nkuku gēsi puta, n'aka-Ya ka ǹtú gēsi puta, n'aka-Ya ka uta agha gēsi puta, n'aka-Ya ka onye ọ bula nāchi n'ihe-ike gēsi puta n'otù.


na ide nile nke ogige ahu buruburu, na ukwu nile ha, na ǹtú nile ha, na udọ̀ nile ha.


na ide nile nke ogige ahu buruburu, na ukwu nile ha, na ǹtú nile ha, na udọ̀ nile ha, tiyere ihe-ha nile, tiyere kwa òfùfè-ha nile: n'aha n'aha ka unu gāgukọta ihe nke ihe-ndebe nke ibu-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan