Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 27:1 - Bible Nso

1 I gēme kwa ebe-ichu-àjàm ahu; ọ gābu osisi acacia, cubit ise bu ogologo-ya, cubit ise bu kwa obosara-ya; ebe-ichu-àjà ahu gēnwe akuku anọ ra nrata: cubit atọ ka idi-elu-ya gādi kwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 “Ị ga-eji osisi akashia wuo ebe ịchụ aja. Ịdị elu ya ga-abụ otu mita na iri sentimita anọ. Ogologo ya na obosara ya ga-aha nʼotu, mita abụọ na iri sentimita atọ, mita abụọ na iri sentimita atọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 27:1
20 Iomraidhean Croise  

Gad we biakute Devid n'ubochi ahu, si ya, Rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Arọna onye Jebus.


Ma ebe-ichu-àjà ọla ahu, nke di n'iru Jehova, o si n'iru ulo ahu, si n'etiti ebe-ichu-àjà-ya na ulo Jehova, bute ya nso, tiye ya n'akuku Ugwu ebe-ichu-àjà-ya.


Ma Eron na umu-ya ndikom nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, na n'elu ebe-ichu-aja nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bayere ije-ozi nile nke ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile, na ikpuchiri Israel nmehie-ha, dika ihe nile si di nke Moses, bú orù Chineke, nyere n'iwu.


O me-kwa-ra ebe-ichu-àjà ọla, orú cubit ka ogologo-ya di, orú cubit ka obosara-ya di kwa, cubit iri ka idi-elu-ya di kwa.


Jeshua nwa Jozadak, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, na Zerubabel nwa Shealtiel, na umu-nne-ya, we bilie, wue ebe-ichu-àjà Chineke Israel, isure àjà-nsure-ọku n'elu ya, dika edeworo ya n'iwu Moses, bú onye nke Chineke.


Moses we wue ebe-ichu-àjà, kpọ aha-ya Jehova-nisi:


Moses we de okwu Jehova nile n'akwukwọ, o bilie n'isi-ututu, wu ebe-ichu-àjà n'okpuru ugwu ahu, ya na ogidi iri na abua, dika ebo iri na abua nke Israel si di.


na ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya:


na ebe-ichu-aja nke àjà-nsure-ọku, na ihe-ọkpukpa ọla nke diri ya, na nkpa-n'aka-ya abua, na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu, na ukwu-ala-ya;


na ebe-ichu-àjà ọla ahu, na ihe-ọkpukpa ọla nke o nwere, na nkpa-n'aka-ya abua, na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu, na ukwu-ala-ya;


I gēte kwa ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ahu manu, ya na ihe-ya nile, do ebe-ichu-àjà ahu nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.


Ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ka ọ dọba-kwa-ra n'ọnu-uzọ ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute, we sure n'elu ya àjà-nsure-ọku ahu na onyinye-inata-iru-ọma ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.


I gētiye kwa ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku ahu n'iru ọnu-uzọ nke ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute ahu.


Ihe-ndebe-ha bu ib͕e ahu, na table ahu, na ihe-idọba-oriọna, na ebe-ichu-àjà abua, na ihe nile nke ebe nsọ ahu nke ha ji je ozi na ákwà-nkwuchi ahu, na òfùfè-ya nile.


Ha gēkpopu kwa ntu n'ebe-ichu-àjà, b͕akwasi n'elu ya ákwa ododo:


ha gētiye kwa n'elu ya ihe nile ya, nke ha ji je ozi n'akuku ya, bú ihe-igu-ọku-ya nile, na ndudu-ya nile, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya, ihe nile nke ebe-ichu-àjà ahu; ha gāb͕akwasi kwa n'elu ya ihe-nkpuchi akpukpọ seal, tinye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime.


Ayi nwere ebe-ichu-àjà, nke ndi nēkpe ekpere n'ulo-ikwū Chineke nēnweghi ike iri ihe si nime ya puta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan