Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 26:31 - Bible Nso

31 I gēme kwa ákwà-nb͕ochi nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: ọ gābu ọlu onye-ọ̀kà, ọ gēme ya ka o yie cheru-bim:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 “Meekwa akwa mgbochi nke e ji ogho na-acha anụnụ anụnụ, ngwakọta anụnụ na uhie, uhie uhie na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, onye ǹka kpanyekwara oyiyi cherubim nʼime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 26:31
30 Iomraidhean Croise  

O me-kwa-ra ákwà-nb͕ochi nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, o we tua akika cherubim n'elu ya.


Ọ buru na echezọm i, Jerusalem, Ka aka-nrim chezọ ǹkà-ya.


I gēme kwa cherubim ọla-edo abua; ihe akpuru akpu ka i gēme ha, na nsọtu abua nke ebe-nkpuchi-nmehie.


na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu;


Ebe-obibim ka i gēme kwa: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu onye-ọ̀kà, ihe ndia ka i gēji me ha.


i gētiye ya n'elu ide acacia anọ amachitara ọla-edo, nkpọye-ha gābu ọla-edo, n'elu ukwu ọla-ọcha anọ.


Ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu gēnwe kwa ákwà-nkwuchi orú cubit, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, bú ọlu onye-ọdudu-ákwà: ide-ha gādi anọ, ukwu-ha anọ kwa.


N'ulo-ikwū nzute, bú n'èzí ákwà-nb͕ochi nke di n'akuku ihe-àmà, ka Eron na umu-ya ndikom gēdo ya n'usoro site n'anyasi rue ututu n'iru Jehova: ọ gābu ukpuru mb͕e ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile site n'umu Israel.


I gēme kwa ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé, ọ gābu ọlu nke onye-ọ̀kà; dika ọlu aluru n'ephod ahu ka i gēme ya; ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ndia ka i gēji me ya.


na ib͕e ahu, na nkpa-n'aka-ya abua, na ebe-nkpuchi-nmehie, na ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi;


Nwayi ọ bula nke nwere obi amam-ihe were kwa aka-ya tu ogho, ha we weta ogho nke ha turu, bú ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, na ezi ákwà ọcha ahu.


O me-juwo ha n'amam-ihe nke obi, ije ozi ọ bula, nke onye nātu akika, na nke onye-ọ̀kà, na nke onye-ọdudu-ákwà, bú n'ogho anunu, na n'ogho ododo, na n'ogho uhie, na n'ezi ákwà ọcha, na nke ọkpa-ákwà, bú ije ozi nke ndi nēje ozi ọ bula, na nke ndi nēcheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche.


na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu;


O we me ákwà-nb͕ochi ahu nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma: ọ bu ọlu onye-ọ̀kà, o mere ya ka o yie cherubim.


O we mere ya ide acacia anọ, machita ha ọla-edo: nkpọye-ha bu ọla-edo; o we wuara ha ukwu ọla-edo anọ.


Onye ọ bula nke nwere obi amam-ihe n'etiti ndi nēje ozi ahu we me ebe-obibi ahu: were ákwà-nkwuba iri me ya; ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, nke emere ka ha yie cherubim, bú ọlu nke onye-ọ̀kà, ihe ndia ka o ji me ha.


Ma onye soro ya n'ọlu ahu bu Ọhọliab, nwa Ahisamak, nke ebo Dan, bú onye nātu akika, na onye-ọ̀kà, na onye-ọdudu-ákwà n'ogho anunu, na n'ogho ododo, na n'ogho uhie, na n'ezi ákwà ọcha.


o webata ib͕e ahu n'ebe-obibi ahu, do ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi ahu, we kwuchi ib͕e ihe-àmà ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.


I gādọba kwa n'ebe ahu ib͕e ihe-àmà ahu, i gēji kwa ákwà-nb͕ochi ahu kwuchi ib͕e ahu.


Le ka nzọ-ukwu-gi nile si ma nma n'akpukpọ-ukwu sandal, gi nwa-nwanyi nke onye amara aha-ya! Apata-ukwu-gi abua nke di buruburu di ka ihe-ichọ-nma, Ọlu aka onye-ǹkà.


Ọ gēb͕u kwa nkpi àjà-nmehie ahu, nke diri ndim, webata ọbara-ya nime ákwà-nb͕ochi, were ọbara-ya me dika o were ọbara oke-ehi ahu me, fesa ya n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, na n'iru ebe-nkpuchi-nmehie:


Jehova we si Moses, Gwa Eron, bú nwa-nne-gi, okwu, ka ọ ghara ibata mb͕e nile n'ebe nsọ a nime ákwà-nb͕ochi, n'iru ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ib͕e ahu; ka ọ we ghara inwu: n'ihi na nime igwe-oji ka agāhum n'elu ebe-nkpuchi-nmehie.


na nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū Eron gābà kwa nime, ya na umu-ya ndikom, ha gākwuda ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi ahu, were ya kpuchie ib͕e ihe-àmà ahu,


Ma le, ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke b͕awara iberibe abua site n'elu rue ala; ala ma-kwa-ra jijiji; oké nkume b͕awa-kwa-ra;


Ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke we b͕awa iberibe abua site n'elu rue ala.


n'ihi na anyanwu nāb͕a itiri: ákwà-nb͕ochi nke ulo nsọ Chineke we b͕awa n'etiti.


N'ihi na Ya onwe-ya bu udo-ayi, Onye mere ihe abua ahu ka ha buru otù ihe, Onye kwada-kwa-ra mb͕idi etiti nke ngige,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan