Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Ọpụpụ 24:17 - Bible Nso

17 Ma nile ebube Jehova anya, ọ di ka ọku nērichapu n'elu ugwu ahu n'anya umu Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ma nʼebe ndị Izrel nọ, ebube Onyenwe anyị na-enwu dịka ọkụ na-achọ irechapụ ugwu ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Ọpụpụ 24:17
14 Iomraidhean Croise  

Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru Ya Afunwuru icheku ọku.


Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya, Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia: Afunwuru icheku site na ya.


nọ na njikere nye ubọchi nke-atọ: n'ihi na ọ bu n'ubọchi nke-atọ ka Jehova gāridata n'anya ndi Israel nile n'elu ugwu Sainai.


Ugwu Sainai nile nākwu anwurù, n'ihi na Jehova ridakwasiri ya n'ọku: anwurù-ya we kwugo dika anwurù nke oké ọku, ugwu ahu nile we ma jijiji nke-uku.


Mọ-ozi nke Jehova we me ka ọ hu ya anya n'ire ọku site n'etiti osisi ntà: o we hu, ma, le, osisi ntà ahu nēre ọku, ma erepiaghi osisi ntà ahu.


M'we hu ihe di ka ib͕u-maramara amber, ihe di ka ọku si di n'ile ya anya nke di nime ya buruburu, site n'ihe bu úkwù-ya n'ile ya anya we rigo elu; ọzọ, site n'ihe bu úkwù-ya n'ile ya anya we ridata ahurum ihe nke di ka ọku si di n'ile ya anya, onwunwu-ọku di-kwa-ra ya buruburu.


Dika eke-na-ogwurugwu si di n'ile ya anya, bú nke di n'igwe-oji n'ubọchi nke miri-ozuzo, otú a ka onwunwu-ọku ahu si di n'ile ya anya, bú nke di ya buruburu. Nka bu ka oyiyi nke ebube Jehova si di n'ile ya anya. M'we hu ya, da kpue irum n'ala, m'we nu olu nke otù Onye nēkwu okwu.


Ònye gēguzo n'iru oké iwe-Ya? ọ̀ bu kwa onye gēguzosi ike n'idi-ọku nke iwe-Ya? awusiwo ọnuma-Ya dika ọku, akwatuwo kwa oké nkume nile site na Ya.


N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, ọku nēripia eripia ka ọ bu, Chineke ekworo.


N'elu-igwe ka O si me ka i nu olu-Ya, ka O we dọ gi aka na nti: n'elu uwa ka O me-kwa-ra gi ka i hu ọku uku Ya; i we nu okwu-Ya nile site n'etiti ọku ahu.


Ma i mawo ta, na Jehova, bú Chineke-gi, Ya onwe-ya bu onye nāgabiga n'iru gi dika ọku nēripia eripia; Ya onwe-ya gēkpochapu ha, Ya onwe-ya gēme kwa ka ha ruru ala n'iru gi: i we napu ha ala-ha, me kwa ka ha la n'iyì ngwa ngwa, dika Jehova gwaworo gi okwu.


N'ihi na unu abiarughi ọku nke apuru idatu ya aka na nke afunwuworo, na itiri, na ọchichiri, na oké ifufe,


n'ihi na Chineke-ayi bu ọku nērechapu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan